Onye isi ojii eturuwo ugo dịka Nwa-ada Ọljiriya

Spread the love

Nwa-ada Khadija Ben Hamou, onye nke tuuru ugo dịka Nwa-ada Ọljiriya nke afọ 2019 ụbọchị Satọdee gara aga akatọọla ndi na-akparị ya maka na ọ bụ onye isi ojii.

“A gaghị eji maka ndi na-akatọ m were daa mba” Khadịja gwara ndi nta akụkọ.

Ime akaja maka ịdị oji, udiri imi nakwa egbugbere ọnụ ya juputara na Facebook nakwa Twitter.

Ndi Ọljiriya dị oji na-enwe ọtụtụ mkpagbu na mba ahụ. Nwa-ada Ben Hamou, onye nke si na Steeti Adrar dị na Mpaghara Ndịda mba ahụ sịrị na ya nwere afọ ojuju ịbụ onye ya bụ nakwa inweta mmeri.

“A na m enwekwa ụmụ agbọghọ ndi ọzọ si na steeti m isonye n’asọmmpi ahụ ma ha chọọ”

Akụkọ anyị nwetara bụ na ọ bụ onye isi ojii nke abụọ na- enweta mmeri na ya bụ asọmmpi kemgbe Nassima Mokadem merichara n’afọ 2005.

N’Ọljiriya nakwa mba ndi ọzọ dị na mpaghara Mgbago Ugwu Afrịka, etu madụ siri chadobe ọcha gosiri ka mma ya ruru.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.