ỌJỊ ỤZỌ KALỤ, ANYỊ ACHỌGHỊ GỊ-NTORỌBỊA ARỌCHUKWU

Spread the love

ARỌCHUKWU: Ọgbaghara dapụtara n’Ihechiọwa dị n’Okpuru Ọchịchị Arọchukwu n’Abịa Steeti ụnyahụ mgbe ndi ntorọbịa obodo ahụ nọchiri onye ji aha otu ndọrọ ndọrọ APC azọ ọkwa Sineti ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Abịa Steeti bụ Dọkịnta Ọjị Ụzọ Kalụ mgbe ọ bịara ịchụ nta nkwado ebe ahụ.

Site n’ozi anyị nwetara, ndi ntorọbịa ndi ahụ dị ọtụtụ jụwara isi na ya bụ Aka chịburu steeti ahụ agaghị agba ụkwụ na be ha ịchụ nta nkwado ebe ọ bụ na oleghara mpaghara ahụ anya n’afọ asatọ ọ nọ n’ọchịchị tinyekwara na Arọchukwu bụ be Sinetọ Mao Ohuabụnwa.

Ha gwara ya hoo!haa!! na ha achọghị ya

Nke a buteziri ọgbaghara ebe a nọzị gbata ọtụtụ mmadụ egbe ma merụkwaa ha ahụ.

Kaosiladị, Mazị Madụka Okoro bụ onye inyeaka mgbasa ozi Dọkịnta Ọjị Ụzọ Kalụ kọwara na ndi ntorọbịa kwụsịrị igwe ụgbọala nna ya ukwu bụ ndi ego o wetara eruteghi.

Ọ kọwara na ụgbọala bụ Dọkịnta Ọjị Ụzọ Kalụ agafeela tupu ndi ntorọbịa kere ọgụ were nọchie ụgbọala ndi ọzọ so ha ụzọ meziri ndi uwe ojii jiri gbaliwe egbe elu

Leave a Reply

Your email address will not be published.