ANAMBARA:IZU ỊBA ỤMỤ NWANYỊ NA-EWUZI

Spread the love

Ọka: Ụlọọrụ ndi uwe ojii n’Anamabra Steeti ekwuputala ka izu ịba ụmụ nwanyị na-ewuzi na steeti ahụ ugbua si emetụ ha n’ahụ.

Ha rịọkwara ka onye ọbụla mụrụ anya dịka azụ maka na oke anaghi eri ihe onye mụ anya.

Ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na steeti ahụ bụ Mazị Haruna Mohammed gbara ama a n’Ọka mgbe ọ gwara ndi nta akụkọ okwu.

Ọ sị na-aka kpaara Chinonye Okorie, nwata nwoke dị afọ iri n’itolu onye jiri izu ịba ụmụ nwanyị mere aka ọrụ n’Ọnịcha ka ọ na-achọ ire ịba ụmụ nwanyị Puku Naịra iri asatọ maka ọgwụ ego.

Harụna dọrọ ndi steeti ahụ aka na ntị ka onye ọbụla kee nkwụcha.

“Anyị na-arịọ ọhaneze ka ha kee nkwụcha ma weta mkpesa n’ụlọọrụ ndi uwe ojii ọbụla dị ha nso maka onye ọbula na-awagharị n’ogbe, na-aga ije dị aṅaa iji gbochi mpụ nkea pụtara ọhụrụ”

Ọ kọwara na ya bụ onye a na-enyo enyo bụ onye Ọgbakụ dị n’okpuru ọchịchị Mbaitoli nke Imo Steeti.

Harụna kwuru sị,” Ndi uwe ojii ime nnyocha doro anya si na CPS, Ọnịcha jidere otu nwata nwoke dị afọ iri n’itolu bụ Chinọnso Okorie onye a na-ebo ebubo izuru ịba ụmụ nwanyị a gbasara n’ụdọ na 21 Ụmụna Street, Ọdọakpụ, Ọnịcha, Anambara Steeti   nke o bu n’obi iresi ndi ọgwụ ego puku naịra iri asatọ”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.