IJIPT:ATỤỌLA ONYE NTA AKỤKỌ NGA MAKA ỊGBA AKWỤLA NWOKE AJỤJỤ ỌNỤ

Spread the love

IJIPT: Ụlọikpe nọ na mba Ijipt atụọla onye nta akụkọ na-arụ n’ụlọọrụ mgbasa ozi televishọnụ nga otu afọ maka ịgba akwụla nwoke na-edina ụmụ nwoke ajụjụ ọnụ n’oge mmemme ya.

Mohammed el-Gheiti bụ onye ụlọikpe sịrị na ọ dara iwu site na ịkwado arụrụ ala maka mmemme ya nke e gosiri n’ọnwa Ọgọstụ  nke afọ 2018 ebe onye ọbịa mmemme ahụ nọrọ na-akọwa ihe bụ ọrụ ya.

El-Gheiti,onye a dakwara nha dọla otu narị n’iri asaa ($170) ka nwere ike itinye akwụkwọ maka mkpegharị ikpe tupu ụlọikpe enye mkpebi ikpeazụ. Ikpe e kpere ya sitere n’akwụkwọ onye ọkaiwu nọrọ onwe ya gbara.

Na nso a, Ijipt malitere iji ike so mmekọ nwoke na nwoke nakwa ịtụkwa ndi dị otu a nga. Mmekọ nwoke na nwoke emegideghị iwu mba ahụ  mana ahụtara ya dịka arụ na mba ahụ nke ọtụtụ ụmụamala ha bụ ndi alakụba. Ịgba akwụla bụ ihe megidere iwu.

hoo!haa!! na-ajụzị: “ebe a tụrụ onye nta akụkọ gbara nwoke a bụ akwụla nga, kedụzị ihe a ga-eme ya bụ nwoke bụ akwụla?  “

Leave a Reply

Your email address will not be published.