Ogbonnaya ọnụ nwere ihe mberede okporo ụzọ

Spread the love

Abakiliki: Dọkịnta Ogbonnaya Ọnụ bụ aka chịburu Abịa Steeti ka anyị nụrụ na o nwere nnukwu ihe mberede okporo ụzọ ụnyahụ n’Abakiliki.

hoo!haa!! nụrụ na ya bụ ọdachi dapụtara ka ọ nọ njem achụmnta nkwado maka Onyeisiala bụ Muhamadu Buhari.

Aka na-achị Ebọnyị Steeti, Injinịa Dave Ụmahị gakwara leta ya n’ụlọ ọgwụ.

Ozi hoo!haa!! nwetara sịrị na e buru Dọkịnta Ọnụ gbagawa ụlọọgwụ n’Abụja.

Leave a Reply

Your email address will not be published.