Nwoke egbuola nwanne ya nwanyị ilu maka ndi ama jihova

Spread the love

Zimbabwe— Nwanyị gbara iri afọ anọ n’ise ka nwanne ya nwoke gburu ilu maka ịnabata ndi ụka Ama Jihova bịara okwu Chukwu n’ụlọ ha dị n’obodo Pangola.

Serina Makasi, ka nwanne ya obere dị iri afọ atọ n’ise bụ  Tawanda Manyori kụnyere ikputu ọnụ ma bokwaa ndi ụka ahụ ebubo ịbụ ndụ otu nzuzo. Ọ zọkwara mba imenye ha egwu ma ha zọbata ụkwụ na be ha ọzọ.

N’ụlọ ikpe, o kwetara na ikpe mara ya. Ọ ga-anọkpa n’ụlọ nga wee ruo abalị iri n’asatọ nke ọnwa Febụwarị nke afọ a bụ ụbọchị a ga-ama ya ikpe.

Makasi nabatara ndi Ama Jịhova madụ atọ bịara izi ozioma tupu nwanne ya nwoke esi n’ime ụlọ pụta bawara ya mba nke buteziri iji ọkpọ were tigwoo ya ihu.

O gazịrị kpesara ndi uwe ojii ndi bịazịrị kpụrụ nwanne ya nwoke ahụ kpọchie

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.