10 Comments

  1. 1. Onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.
    2. Onye nna ya dunyere ohi, na -eji ụkwụ agbawa ụzọ.
    3. Ụzọ dị mma agaa ya ugboro abụọ.
    4. Osisi kwụchịrị ụzọ na-eri ube mma.
    5. Agbaghị ụzọ owere mgba ọ naghị echi.




    0



    0
  2. 1. Agụghe ụzọ, agụghe ọnụ.
    2. Onye n’amaghị ụzọ iyi, sowe mpempe ite.
    3. Onye bi n’ụlọ ugegbe anaghị atụ okwute.




    0



    0
  3. 6. Ụzọ eji nwa anaghị echi echi.




    0



    0
  4. 7. Egwu anaghị atụ afọ oburu ụzọ.
    8. Anụ bụ ụzọ na-anụ mmiri ọma.
    9. Onye buru chi ya ụzọ o gbagbuo onwe ya na ọsọ.
    10. Ụzọ nwanyị abụghị ụzọ nwa.




    0



    0
  5. Author

    1. Ụlọ anaghị ada hapụ uko
    2. Anaghị eji iwe oke esu ụlọ ọkụ
    3. Onye banyere ụlọ nwanyị ọmụgọ ma ihe ọ mụrụ
    4. Oke bi n’ụlọ gwara nke bi n’ọhịa na azụ dị na ngịga
    5. Anaghị awara onye ụlọ ọgọdọ mkpụda
    6. Ụzọ dị mma a gaa ya ugboro abụọ
    7. Ụzọ e si kpụrụ onyeike ka a ga-esikwa kpụrụ onye ume ngwụ
    8. Onye nọ n’ụlọ nọọrọ onye gara ahịa, onye gara ahịa gaara onye nọ n’ụlọ
    9. Ọ na-adị mma ka ọ bụrụ ebe e si rigoo elu ka e si aritu
    10. Onye chọrọ ịghọtacha ihe nile akpaka mịrị anaghị esi ụzọ o siri rigoo were rituo




    0



    0
  6. 11. Onye ụgwọ ebighị n’ụlọ.
    12. A na ebu ụzọ jide anụ egbe n’aka tupu ajụọ na nwanyị a na-eri ya.
    13. Onye ọbịara anaghị asị na ọ nọghị n’ụlọ.
    14. A na- amara mma site n’ụlọ pụọ na ama.
    15. Ahịa anaghị ahọ nwaagbọghọbịa ụzọ n’abụ ; ọ dịghị mma ọlụlụ, ọ dị mma enyi.
    16. Dike mee nke o ji, anya a dị ya n’ụzọ ụla.
    17. Edupuga nwata n’ama, ọ sị na ya amarala ụzọ ụla.
    18. Ejula ụlọ bụ ejula nsị.
    19. E were ọbere kwaa ụzọ, nnukwu gaa ya ọtọ.
    20. Mbe na-ebu uzọ amara ala na be ndị ọgọ ya, tuọu ọ chọwa onye ọ ga-aghọgbu.
    21. Mmadụ tachara ọkpụkpụ tọchie ya ụzọ, ọ maa ya; kedụzi uru ọ nwere?
    22. Nnụnụ juru elu n’ala, jukwa ọhịa n’ụzọ, naanị aha nnụnụ nwata mara bụ egbe.
    23. Nwoke mara obi nwunye ya, ọ chịnye ya igodo ụlọ.
    24. Nkpu bara eze nwoke ọnụ, eze nwanyị buru ya ụzọ na-eti.
    25. Nwanyị na-azọ ngbala buru ụzọ zọọ di ya.
    26. Ngwere agbakaghị ụlọ ọ bụ ya tụrụ.
    27. Nwanyị buru ụzọ daa isi mkpe na-erere ibe ya ihe.
    28. Onye nsị na-akpa na-ebu ụzọ.
    29. Ọ gara iyi aghụghị ahụ, ọ nọ n’ụlọ ka ya mma.
    30. Onye aṅwụrụ na-akwụ anaghị ahụ ụzọ.
    31. Ọnweghị onye ya na Chi ya dị na mma, ọ chọrọ ụzọ be dibịa gawa.
    32. Okwu ọma ọ gara ebee, ajọ okwu jiri buru ụzọ?
    33. Onye ụlọ kee nwanne ya n’abọ, onye ezi ebufuo ya.
    34. Ọkwa onye hụ ụzọ, ọ wee hụwa arụsị ọ kwere nkwa.
    35. Ọbụghị onye bu ụzọ kpọọ ndị uwe ojii na- ekpegbu.




    0



    0
  7. 36. Ọ bụ otu okwu a na-ekwu n’ụlọ ka a na-ekwu n’ahịa; kama, e kwuo ya n’ahịa, akpọọ ya okwu ahịa.
    37. Onye tara ahụ nọchie ụzọ ọba; ọ dị ka ọ na-arịọ arịrịọ ji.
    38. Onye gbabara n’ụlọ kpọchie ụzọ ma nyụọ ahụrụ; ihe ọ wepụrụ ka ọ werekwaara.
    39. Achụba aja ịpụ n’ụlọ,oke tụnye ego ngwere tụnye ; n’ihi na ọkụ gbaa ụlọ, oke abụrụ oke ọhịa, ngwere abụrụ ngwere ịkpa.
    40. Nnekwu ọkụkọ sị Okeọkpa na ọ bụrụ na ya mara na ihe ọ na-akpọrọ ya ga-ebi ọsọọsọ, na yaxkaara ịhapụ ịgba isi ụlọ okirikiri.




    0



    0
  8. 41. Ọkụ dakụsam, dakụsa nwa m, e buru m ụzọ kụchapụ nke m.
    42. E gbuo dike n’ọgụ ụlọ; ọgụ ama ruo, a chọwa dike.
    43. Ọ na abụ onye bu ụzọ mara ezigbo akwa, ajụjụ egbuo ndị kpe azụ.
    44. Ọ na abụ amamihe buru ụzọ, ụtọ akwaa.
    45. Onye gawa agawa nyụchie ụzọ, ọ lawa alawa ozute ijiji.
    46. A na-ebu ụzọ azọta ala tupu azọwa ute.
    47. Ọ bụ ndị ama ka a na-yiri uwe mwụda; onye ụlọ ọbụla mara ebe apa nwanne ya dị.




    0



    0
  9. 48 Ọkpụ ụzọ enwe ilo.
    49. Mbe sị na-egbuo ya sị tụchie ya ụzọ; ọ ga abụ onye hụ ya kwụkwaa eziokwu ihe mere ya ya, egbukwasị ya.
    50. Agakata n’ihu laghachiwe azụ, ndị bu ụzọ ekpere azụ.




    0



    0
  10. Author

    ỌGBỤGBA OKWE ASỌMMPI ILU MAKA ỤLỌ/ỤZỌ: UJU NWANEKEZIE 48 (50), MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 10 (10), DỌKỊNTA NNAMDỊ ACHỤKỌ 3 (3)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.