ASỤSỤ IGBO AGAGHỊ ANWỤ N’ANỊỌMA-OKỌWA

Spread the love

ASABA: Aka na-achị Delta Steeti bụ Dọkịnta Ifeanyi Okọwa ekweela ndi nkuzi na ndi ntorọbịa Anịọma nkwa na ọchịchị ya ga ewepụ nkuzi olumba ndi Anịọma ọbụla n’ụlọ akwụkwọ dịgasị na steeti ahụ.

Ifeanyi Okowa toro ha maka mbọ pụrụ iche ha gbara maka ịdịnotu ndi Anịọma. Ọ kọwara na ọchịchị ya ga akwụsị nkuzi olumba ndi Anịọma dịka Ndokwa, Ịka nakwa Enuanị n’ụlọ akwụkwọ primary ma malitekwa ikuzi Igbo Izugbe n’ụlọ akwụkwọ nile dị n’Anịọma iji welite ọmalịncha omenala n’usoro obibi ndụ Ndigbo nke ndi Anịọma nwere.

O kwere nkwa a ụnyahụ ka ya na ndi IZU ANỊỌMA na-akparịta ụka maka ịkwalite omenala n’asụsụ igbo na mpaghara ahụ.

“Afọ juru m n’ọbịbịa unu bịara ebea mana anyị ga-ekele CHUKWUOKIKEABIAMA maka inye anyị mmeri na nhọpụta” Okowa kwukwara

Chetakwa na n’ọnwa olemole gara aga, ndi Ịgbanke nakwa ogbo ha ndi ọzọ bụ ndigbo nọ n’Edo steeti dịka Igbanke, Iru, Ohezenaka, Otobaye, Ugbeka dị n’Okpuru Ọchịchị Orhionwon. Ndi ọzọ bụ Oghada dị n’Okpuru Ọchịchị Uhunmwode nakwa Ekpon dị n’Okpuru Ọchịchị Igueben.

hoo!haa!! na-asịzị Aka na-achị Delta Steeti bụ Sinetọ Ifeanyi Okọwa ya jide ka o ji.

3 Comments

  1. http://www.zap96.com We recommend Baccarat site.

    New subscription (KRW 30,000) payment !! I do not have any regrets.
     
    Enjoy the game safely at Korea’s leading online casinos on casino.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.