4 Comments

  1. 1. A gbanahụ mmiri n’ọsọ; anaghị agbanahụ ala n’ọsọ.
    2. Ama mmiri zoro ezo mara nke emere mwụpụ.
    3. Awaị taa mmiri, kedụzi ụtọ ya?
    4. Atachara yọkọm, ewere ọnụ mmiri lofee ye.
    5. Anaghị enwechaa osimiri were ọnụ mmiri na-eso mma.
    6. Agaghị m anọ n’mmiri were ọnụ mmiri na-akwọ aka.
    7. Kedụ ebe agba gara mgbe mmiri na-ama eze?
    8. Mmịri riri enyi ka mbe na-amakwara ọgọdọ.
    9. Mmiri zochaa , ọ laa n’olulu.
    10. Onye buo mmiri buo nkụ, ọ mara nke ka arụ.
    11. Osimiri sị na ya ejighi nke mmadụ eto.
    12. Onye beere anwụ , beere mmiri ya nọdị ebee kpata ihe oriri?
    13. Ụkwụ ka e ji achọ ihe dara mmiri.
    14. Anya mmiri na-agba na ọwara ya.
    15. Ije anyị ga abụ ije mmiri, ọ gaghị abụ ije nkụ.
    16. Mmiri na-amachi ije ụkwụ ma ọ naghị amachi okwu ọnụ.
    17. Anụ bụ ụzọ na-aṅụ mmiri ọma.
    18. Ọ na abụ ehi gwufee mmiri ọ fechaa ọdụ.
    19. Mbekwu hụrụ osimiri na-awakwa akwa; ọ ga-awụ awụ ka ọ ga-efe efe?
    20.Ama ka mmiri ama ọgazị, agwa ya apụghị ịpụ ya n’ahụ.
    21. Mmiri mara ugo sara ya ahụ.




    0



    0
  2. 22. Egbugbere ọnụ anaghị anọrọ mmiri amaa eze.
    23. Ike ọzọ; obi ọzọ,,kọatara mmiri ji na-ezo nsị a na-akpa mmadụ.
    24. Nsịkọ na-echi eze n’obere mmiri.
    25. Nwoke dị ka ji anwụ, a naghị esi ya otu nta mmiri.
    26. Nshịkọ gwuru mmiri ukwu , gwuo mmiri nta, ma naanị ite ofe agadị nwanyị agbagbuo ya.
    27. Ihe ọkụkọ ji mmiri achụ dị ya mkpa.
    28. Oke soro ngwere maa mmiri, mmiri kọọ ngwere ọ gaghị akọ oke.
    29. Mmiri idei bute akụ, o zụo ụwa ọnụ..
    30. Onye eze dị ka ya taa nkume ka e nyere anụ ọkpọọ jụọ ya ma a ga-abanyere ya na mmiri.




    0



    0
  3. 1. Onweghi ka mmiri g’eji zuochaa ala agaghi ama.
    2. Mmiri doro n’eju dorola nwa nkita.
    3. Ndu mmiri, ndu azu.
    4. Obughi mmiri nile zurunu ka-ana echepuru ihe.
    5. Oke soro ngwere maa mmiri, ya kuola ngwere, ogaghi akorola oke.
    6. Azu okpo gwuru mmiri nta, gwuo mmiri ukwu ma lagbuo n’ite ofe agadi nwanyi.
    7. Nshiko gwuru mmiri ukwu, gwuo mmiri nta ma ite ofe nwanyi asukpoo ya Anya.
    8. Mmiri ejule awo onu.




    0



    0
  4. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 28(30), DỌKỊNTA ACHỤKỌ 8(8)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.