ADELEKE:ỤLỌIKPE BỤZỊ NGWA ỌRỤ ASO ROCK-IPOB

Spread the love

 

Otu Indigenous People of Biafra, IPOB, ebowo ndi ọkaikpe Naịjiriya ebubo ịbụzị ngwa ọrụ ndi “isi aba okpu” nọ n’Aso Rock karịa ịbụ ọnụ na-ekwuru ndi ọnụ erughi n’okwu.

Otu a mekwara ka ndi Naịjiriya mata na ndi ọkaikpe bụ sọọsọ onwe ha ka ha ma.

Ka ọ na-etinye ọnụ na nkagbu ụlọikpe kagburu ikike nke Ademola Adeleke nke Peoples Democratic Party, PDP, iji soro zọọ ọkwa na nhọpụta Gọvanọ e mere n’Ọshụn Steeti, IPOB kọwara ụlọikpe Naịjịriya ka nke kacha nwee ndi ọkaikpe bụ ndi arụrụ ala nakwa ndi ikpe nkwọtọ kacha arụ afọ n’ụwa nile.

N’ozi nke ọnụ na-ekwuru otu a bụ Emma Powerful tinyere aka, IPOB kọwakwara na onye ndu ha bụ Mazị Nnamdi Kanụ ga-anọ taa n’elekere asaa nke uhuruchi na Redio Bịafra were gbaa ndi ụlọikpe Naịjiriya n’anwụ dịka ndi nke kacha n’arụrụ ala, iri ngarị nakwa ime mpụ.

Powerful kwukwara sị, “Ụlọikpe Naịjiriya kwesịrị ịbụ ebe mgbaba ndi n’enweghi mmadụ bụzị ebe ana ememina ndi ndi isi ọchịchị chọrọ ka e meminaa”

“Ụlọikpe Naijiriya bụzị ngwa ọrụ ndi “isi aba okpu” nọ n’Aso Rock, ha achọghịzị ịma maka ndi enweghị mmadụ.

“Kedu ka ụlọikpe ga-esi nye udiri mkpebi a maka Adeleke banyere nhọpụta gọvanọ nke Ọshụn Steeti ebe Onyeisiala Muhammadu Buharị ewepụtabeghị asambodo WAEC ya ruo taa”

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.