AKA AKPARALA ỌGBA AKA EWE EGO NA ATM

Spread the love

IBADAN –Otu nwokọrọbịa bụ Azeez Morufu ka aka nọrọ ụnyahụ na Dugbe dị n’Ibadan kpara ka ọ na-ewere ego n’igwe ATM n’ejighi kaadị ATM ọbụla.

Ọ bụzị onye na-agafe hụrụ ihe ịtụnanya a were tie mkpu mere ka ndi nche ụlọakụ ahụ dị n’akụkụ ụlọọrụ Redio Naịjiriya, Ibadan were jidezie ya. Ego ọ dọọrọ gbakwara ọkpụrụkpụ.

Morufu, onye kọwara na o teela o ji akpa udiri agwa ahụ kọwara na ya nwere usoro “code” nke ọ na-apinye n’igwe ATM iji were ego n’ejighi kaadị ATM ọbụla.

A kpugazịrị nwa amadị n’ụlo ndi uwe ojii.

Ụmụ Naịjiriya, unu di egwu! hoo!haa!!

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.