“UNU EBICHARAZỊLA ANYỊ” ỤMỤNWANYỊ NA-AGWA NDI AHỊA

Spread the love

Legọsị: Ndi ahịa ụmụ nwoke ka ụmụ nwanyị na-abịa ahịa Yaba dị na Legọsị dọrọ aka na ntị ka ha kwụsị ibichara ha aka n’ahụ ma ha bịa ahịa ahụ.

Nwaada Medlyne Reuben bụ nwata akwụkwọ na mahadum UNILAG kwara arịrị banyere ajọ ọnọdụ nke ọ sị na ndi ọkacha njọ bụ ndi na-ere ọkịrịka.

Ịgba ajụjụ ọnụ nke akwụkwọ akụkọ Guardian mere ụmụ nwanyị dị otu narị n’ise (105) na Febụarị afọ a gosiri na ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ n’ime ha enweela udiri inye nsogbu a n’ahịa dịgasị na Naịjiriya.

Kaosiladị, ndi ahịa kọwara na ọ bụ ụzọ ha sị eme ka ahịa na-aga. “Anyị bụ ndi ọgba mbọ, oge ụfọdụ imetụ aka na-adịkwa mkpa” bụ okwu Viktọ Robinson, na-ere traụza ụmụ nwanyi na Yaba.

Onye ahịa ọzọ, Emmanuel Ugorji, sịrị na ụmụ nwanyị na-eso akpata ya bụ mbichara. “E nwere ụmụ nwanyị na-agba ọtọ agagharị nke na-ebute ya bụ mbichara ”

Ụmụ nwanyị agbachighikwa nkịtị banyere ya bụ ọnọdụ.

N’ọnwa Ọktoba gara aga, Damilola Marcus malitere otu ọ kpọrọ Market March Movement iji kpochapụ mbicharụ a na-ebichara ụmụ nwanyị na Yaba nakwa ahịa ndi ọzọ dị na Naịjiriya.

Marcus, bu ose ụlọ (architect) sịrị na ike agwuwo ya maka ya bụ mbichara nakwa ime akaja dị iche iche n’ahịa ahụ.

N’ọnwa Disemba gara aga, chịkọbara ngagharị iwe nke a kpọrọ “Market March” n’ahịa Yaba. Oge ahụ, ụmụnwanyị yi uwe edo edo e dere “Unu ebicharazịla anyị” were gagharịa n’ahịa Yaba.

Ka ụmụ nwanyị na-ekwe ” unu ebicharazịla anyị” were mere ngagharị iwe na-aga, ndi ahịa ụmụ nwoke iwe ji malitere tụwa okwute na mmiri na-ekwukwa na-asị, “Anyị ga na-ebichara!”

Ibichara ụmụ nwanyị megidere iwu Legọsị Steeti ma bụrụkwa nke na-ebute nga afọ atọ. Mana Marcus kwara arịrị na ndi uwe ojii anaghị etinye iwu ahụ n’ọrụ.

Otu ahụ chịkọbakwara udiri ngagharị iwe ahụ n’ahịa Ogbete, Enugwu n’abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Maachị afọ a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.