“Word4Word Art Project”na-afịọ n’Enugwu

Spread the love

Enugwu: Ngosipụta Nka “Word4Word Art Project” na-aga n’ihu ugbua n’Enugwu n’ogige National Gallery of Arts, Enugwu.

Site na nkọwa Mazi Ikenna Nwachukwu bụ onyeisi otu Word4Word Art Project, ngosipụta  nka a ga na-abụ kwa ọnwa atọ. 

Ikenna Nwachukwu, onyeisi Word4Word 

Isiokwu ngosipụta nka nkea bụ “Omenala Ọchịchịrị” nke na-arụtụ aka na ọchịchịrị jupụtara n’usoro ọchịchị Naijiria ugbua, ebe arụ gbazịrị afọ ma bụrụkwa omenala.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ya bụ ngosipụta nka ga-adị site taa bụ abalị iri n’ise nke ọnwa Juun wee ruo n’abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa a.

Ebumnuche ngosipụta nka a bụ igosi àjà ọnọdụ Naijiria iji mee ka ndị ọchịchị nakwa ụmụ amaala ala anyị chemie echiche banyere idozigharị ọnọdụ obodo anyị.

Ụfọdụ ndị nwere agba bịara ya bụ mmemme gụnyere Ichie Joe Musa-Onye bụbu nnukwu onyeisi ụlọ ọrụ Nigerian Gallery of Arts, Mazi Kevin Ejiofo-Onye jibu ọkwa and a few hi bụ people Idịka Nnukwu Onyeisi ụlọ mgbasa ozi FRCN, Dọkịnta Ayo Adewunmi-Onye nhazi nka, otu LIMCAF, wdg.

Ụfọdụ ndị omenka na-esonye na ya bụ ngosipụta nka nakwa ọre ole ha wepụtara gụnyere Okwuchukwu Eseagwu si  Benin (ọrụ abụọ), Benjamin Ejuohuo si Port Harcourt (ọrụ abụọ), Wilson Chukwu ka Clifford si Port Harcourt (Otú ọrụ ), Gabriel Kings Christian si Abuja (ọrụ abụọ) , Lawrencia Ozioko si Nsuka (ọrụ abụọ), Kenechukwu Azuakor si Awka(ọrụ abụọ ) tinyekwara Francis Abonyi si Port Harcourt (otu ọrụ). N’ime ọrụ nile, nke kacha pụta ihe bụ ọrụ Okwuchukwu Eseagwu, onye nke e jikwa Don Okes mara ihe e sere ese ọ kpọrọ “Agony of a nation ” iji gosi aja ọnọdụ Naijiria nọ n’ime ya ugbua. 

Esere ese “Agony of a nation” 

Mazi Nwachukwu rịọkwara Ọhaneze ka ha bịa dọnyere ha maka na ndị omenka nwere ọrụ pụrụ iche ha na-arụ iji mee ka obodo dị mma

Leave a Reply

Your email address will not be published.