Abụja: Otu onyeisi n’ụlọ ọrụ West African Examination Council (WAEC), Osidehinde Adewunmi,nọrọ ụbọchị Wenezdee, abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Julayị were kọwaa na asambodo Cambridge University’s Moderated International Examination nke Onyeisiala Muhammadu Buhari wetara n’ihu ụlọikpe nhọpụta onyeisiala dịka ihe akaebe bụ adigboroja. Akwụkwọ abụọ a nabatara dịka AkaebeRead More →

Abụja: A kpọlitewo Sinetọ Ifeanyị Ụba dịka Osote Onyeisioche Kọmitii na-ahụ maka  Ngwupụta Mmanụ Agbidi nke Sineti ala anyị. Sinetọ Ụba na-anọchite anya mpaghara Ndịda Anambara ma bụrụkwa sọọsọ ya bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Young Progressives Party (YPP) nọ na Sineti Naịjiriya. N’okwu ka a akpọlitechara ya n’ọkwa ahụ,Read More →

Abụja: A kọwaala na ejije omenala dị oke mkpa ugbua na ndụ Ndigbo maka ọnọdụ ha taa na Naịjiriya. Dọkịnta Okwesịlịeze Nwodo, Gọvanọ chịburu Enugwu Steeti ochie ma bụrụkwa onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’ala anyị n’oge gara aga kwupụtara nkea na mmemme ngosipụta mbụ ejije ọhụrụ a kpọrọ ỌkaRead More →

Ịndoneshiya: Aka akparala otu nwoke bụ onye nche n’ụlọ nleta anụmanụ (zoo) dị na Surabaya na mba Ịndoneshiya maka ịkwasa ụmụ anụmanụ iko nke na ọ tụwazịrị utobo ime. Ozi si n’ụlọ mgbasa ozi “the Kalimantan Press” sịrị na ya bụ nwoke, Serelat Ingul Adha, onye dị iri afọ atọRead More →

 Ọgbakọ jikọtara ndị ndu mpaghara Ndịda na mpaghara Obinetiti ala anyị, Southern and Middle Belt Leaders Forum(SMBLF) akọwaala izi ndị Miyetti Allah maka ọgbakọ ndị ndu mpaghara Naijiria dị iche iche dịka oke mkparị N’akwụkwọ ozi nke ndị isi otu a degaara Ọchịagha Abdusalam Abụbaka (Lagoro Ezumike) bụ onye kpọrọ yaRead More →

Enugwu:  Ndi Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nọrọ n’ọgbakọ ha nwere taa bụ Sọnde, abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Julayị afọ 2019 nke gbasara ugbua n’Enugwu were jụkwa ihe ọbụla banyere Ruga ọzọ. Ha sịrị “waawa” n’atụmatụ ahụ maka na ala adịghị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma ya fọdụzịa nkeRead More →

Enugwu: Okwu Ruga (ndị nchị ehi) so n’isi okwu Ndigbo tụrụ anya ka e lebaa anya n’ọgbakọ Ndi Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nọ ugbua bụ Sọnde, abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Julayị afọ 2018 n’Obi Gọọmenti Enugwu Steeti, Enugwu. Ndị bịara ọgbakọ a gụnyere Rt. Hon Ifeanyi Ugwuanyi (GọvanọRead More →

Enugwu: Ichie Ọkaikpe Kennet Agbowo (KOK), bụbu Kọmishọna maka Usoro Mmefu Ego na Nhazi (Budget & Planning) n’Enugwu Steeti n’oge ọchịchị Gọvanọ Sullivan Chime anwụọla. KOK, nwa-afọ Owo dị n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Nkanụ ma sorokwa na ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’Enugwu Steeti nwụrụ n’ụtụtụ taa bụ Sọnde  abalịRead More →

Jalingo: Ndi Fulani na-achị ehi ewegharala obodo iri n’asaa na mpaghara Kona, Taraba Steeti. Onye eze na-achị Kona, Ichie Ọgọstin Njameng kwupụtara nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Fraịdee, abalị iri abụọ enje nke ọnwa Julayị na Kona. Ọ kwa kwara arịrị maka mwakpo ndi nchị ehi na-awakpoRead More →

Bini: Gọọmenti Edo Steeti amalitewo ịsụcha ụzọ n’oke ọhịa dị n’ụzọ awara awara si Bini gaa Ore. Nkea bụ iji nyere ndị Uwe ojii aka n’agha ha na-ebuso ndị  ntọ ndị bi n’oké ọhịa ndị ahụ. Mazị DanMallam Mohammed, kọmishọna ndị Uwe ojii n”Edo Steeti kọwara na-aga asụcha ọhịa ndịRead More →

Makurdi: Otu ụmụ akwụkwọ na Naịjiriya bụ National Association of Nigerian Students (NANS) etierela ụlọ ọrụ nzikọrita ozi MTN ka ha laa na  Naịjiriya. Nke a mere ụbọchị Fraịdee abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julayị, oge ndị otu a mere ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ MTN na Makurdi bụ isiRead More →

Legọs: Òtù onye ndu ndị mpaghara Naija Delta, Ichie Josef Eva ekwuola na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ga – awụ onwe ha n’ala n’Edo Steeti ma ọ bụrụ na ha akpachapụghị anya. Eva kwuru nkea n’ụtụtụ Fraịdee, abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julayị afọ a, oge ọ bụRead More →

Abụja: Dọkịnta Katch Ọnọnuju, Otu onye n’ime ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP agbaala ama  na o nweghị onye Awụsa aha ya so na ndi Onyeisiala Muhammadu Buhari zigara ndị Sineti ajụjụ nnyocha. O kwuru nkea oge ọ na-ekwu uche ya n’ụtụtụ Fraịdee, abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julayị afọRead More →

Abụja: Sinetọ Ben Ụwajụmogu anatawo  asambodo nhọpụta n’aka ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) dịka sinetọ na-anọchite mpaghara Mgbago Ugwu Imo Steeti. Site na nkea Ụwajụmogu bụ Sinetọ ikpeazụ na-abata na Sineti nkea. INEC mere nkea ka ndị  nkwado Sinetọ a mechara ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ ha n’Abụja abalịRead More →

Onịcha: Ụlọikpe Anambra Steeti, Ọnịcha nọ ụbọchị Tuuzdee, abalị iri abụọ n’atọ were tụọ Onye Nlekọta (Manager) nakwa Onye Nlekọta Azụmahịa nke ụlọ ọrụ EEDC ngalaba Ọnịcha nga ọnwa atọ maka ịmagbunye ndị ahịa ha ụgwọ na-agbaka isi Ndị kpụgara ha ụlọikpe bụ  ndị isi otu ahịa Iweka Electronic AmalgamatedRead More →

Dee Dona anaala Nwannaa Bori aka na nhọpụta ya dịka Onyeisiala mba Briteenụ. Ha abụọ dịka “ọ tọrọ onye n’onye”. A jụọ ase ọfụma, o nwere ike bụrụ na otu nne mụrụ ha abụọ. Ya bụ na Dona ñụfọọrọ Bori ara. Ha abụọ bụ ndị azụ anụ ụka, ndị a na-ekwu Read More →