E DINARA M NWANNE DI M, CHEE NA Ọ DỊ M-NWANYỊ A NA-AGBA ALỤKWAGHỊM

Spread the love

Legọs: Oriakụ Kuditat Ajayi, dị afọ iri ise n’abụọ agwawo ụlọ ikpe omenala nke Igando, Legọs na ya dinara nwanne di ya nwoke chee na ọ bụ di ya.

 

Dị ya bụ Akande chọrọ ka ụlọ ikpe kpọsaa alụmdi na nwunye ha nọworo iri afọ atọ n’ise maka na nwunye ya na-agba n’ezi.

Ma nwanyị na-agọrọ isi onwe ya

”E dina m n’abalị oge nwanne di m bakwutere m n’ụlọ di m nwetara m.

“E che m na ọ di m’ maka na ihe ahụ bụ oge di m ji abịakwute m ka anyị mekọọ, site n’elekere itoolu ruo elekere iri nke abalị.

” Ọ mgbe anyị mekọchara ka m chọpụtara na ọ bụghị di m. Ka m bawara ya mba, ọ sị na ọ bịara dina m maka na di m mere njem.

“Mgbe m kpesara nwunye ya, ọ sị m’ agwala di m ka udo dị”

Nwanyi a ji ụmụ anọ rịọrọ ụlọ ikpe ka a ghara ikposa alum dị na nwunye ha, na ya ka hụrụ di ya n’anya n’agbanyeghị na ọ na-eketa ndị nwunye ya ndị ọzọ nakwa ụmụ ha anya karịa ya na ndị nke ya.

Hmm, hoo!haa!! na-ajụzị ụmụ nwanyị:” Nwoke ọzọ enwere ike dinaa gị  ị chere na ọ bụ di gị?” O nwekwara ka ọ dị

Leave a Reply

Your email address will not be published.