ỌBASANJỌ NA BUHARỊ:EGBE ỌNỤ NDỊ SOJA

Spread the love

Onyeisiala Naịjiriya n’oge gara aga, Olusegun Ọbasanjọ na Muhammadu Buharị, onyeisiala Naijiriya na-agbakọrịta egbe ọnụ maka akwụkwọ ozi Ọbasanjọ degaara  Buharị.

N’akwụkwọ ozi nke abụọ a, Onye amụma Ọbasanjọ degaara Onye eze Buharị, ọ na-enye ya ndụmọdụ ka o wepụ aka enwe n’ofe iji mee ka agha ghara ịda n’obodo Naịjiriya.

Ọbasanjọ kọwara na ọ dị mkpa na Buhari lebara anya nke ọma na nsogbu enweghị ezi nchekwa nke jizi mpaghara Naijiriya nile n’olu ọkacha okwu banyere ụmụnna ya ndị na- achị ehi.

 

Kaosiladi, ndị otu Miyetti Allah tiziri mkpu na Ọbasanjọ mere arụ maka ya bụ ndụmọdụ ọ nyere nke ọ nweghị onye rịọrọ ya. Ha kpọrọ oku ka a kpụrụ ya kpọchie, na ọ chọrọ ibute ọgbaghara.

N’aka nke ọzọ, oke nkịta ji isi anya ọkụ, Femi Fani Kayode sịrị na ihe Ọbasanjo mere ziri ezi. Ọ gwakwara ndị Miyetti Allah na ndị ọzọ ọ na-ewe iwe ka ha ga nwụọ.

Ndị be anyị, nsogbu dịkwa. Ebe ndị ọchịagha abụọ na-agba egbe ọnụ, onye ga-etinyeziri ha ọnụ. Kaosiladi, ụwa ma nke bụ eziokwu na onye asị “raa ka i ji” anaghị eme ọfụma

Leave a Reply

Your email address will not be published.