ORINGO EGBUKWEE HA! ỤLỌ “ORINGO” CHỌRỌ IDAGBU NDỊ MMADỤ

Spread the love

Abakaliki: Nwoke na nwanyị bịara ịgbara oringo so na ndi ụlọ oriri na nkwari (hotel) kara idagbu n’Abakiliki ụnyaahụ.

Ya bụ ụlọ oriri na  nkwari bụ Metro view hotel nke dị nso na mpaghara mahadum Ebonyi State University, Abakaliki dị na Presco bụ ebe eji ịgba oringo mara.

 

 

Nwoke na nwanyị a amaghị ma ha abụ di na nwunye ka ha ana-eme enyi, site n’ozi ndị anyị nwetara dịbu na mbụ arahụ ebe ahụ iji mee onwe ha obi ụtọ.

Ụlọ oringo a na-ekwo ekwo n’ihi mpaghara mahadum ahụ didebere ya maka na ọtụtụ ndị okongwu na-achụ ụmụ akwụkwọ ndị nwanyị na-agụ na mahadum ahụ bụ ebe ahụ ka ha na anọ ekpori ndụ.

 

N’okwu ya, Ichie Austin Orji  bụ onye gwara ndị nta akụkọ okwu kọwara na chọpụtara na ụfọdụ ide ji ụlọ ahụ na-agbawasị ma gbakwaa mbọ imezi ya. Ọ sị na ọ bụ ndozi ahụ ka ha na-eme ụlọ jiri daa.

Ka ọ bịara njem nchọpụta n’ebe ahụ ụlọ dara, Hon Ejem Okoro bụ Onye inyeaka Gọvanọ Steeti ahụ n’okwu banyere isi obodo Steeti ahụ tiri iwu ka e mechie ụlọ oriri na nkwari ahụ wee ruo na-achọpụta ebe mmiri si baa n’opi ụgbọrọ.

hoo!haa!! asịghịkwa sị agbazịla oringo kama onye na-agba oringo, ya mekwaa n’aha nna (ekpere) ka ọ ghara ịnwụ n’elu ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.