NỌNSO DIOBI ZIRI M ỤZỌ – YUL

Spread the love

Legọs : Yul Edochie esoghị na ndị eri agọ. N’ozi ịtụ mma o zigara omebe ejije ibe ya bụ Nọnso Diobi na Ncheta Ọmụmụ ya n’ụbọchị Tọọzdee, abalị iri n’asatọ nke ọnwa a n’instagram, o toro Diobi maka izi ya ụzọ mgbe ọ bịara Legọs ọhụrụ.

“N’agbata afọ 2005 na 2006 ka m bịara Legọs igba mbọ ịma ma ohere isoro mebe ejije a ga-eru m’ aka.

Mụ na Nọnso zutere n’ọgbọ mmebe ejije, ọ bidowori iwu ewu oge ahụ. Anyị tọwara ozigbo.

Ọ gwara m sị :” Bịa soro m biri, be nwanne gị nwoke ebe i si abịa tere anya. Ị ga-esikwa ya mata ọtụtụ ndị nwere agba na mmebe ejije.

Yul Edochie kọwakwara ka Nọnso Diobi siri zụọ ya nri,” Ezigbo mmadụ a nyere m ebe m dewere isi na Legọs ma zụkwaa m nri na-atamughi chaa chaa.

“Nonny, e chefubeghi m. Nwanne, Chukwu gọzie gị. Ncheta Ọmụmụ, ka Chineke mezuoro gị ihe ọbụla na-akpa gị  Iseeee!

Unu ahụla na agwọ aghaghị ịmụ ihe ogologo. Yul egosiwo na ọ bụ nwa Ọgadagidi Pita Edochie, nwa a zụrụ azụ.

hoo!haa!! na-agwazị ndị ntorobịa ndị ọzọ ka ha ñomie Yul ma ghara ịbụ eri agọ. N’aka nke ọzọ, ka Chineke gọzie nwa-afọ Igbo bụ Nọnso Diobi nye ya ezigbo nwunye ka ọ ghara ịdabara ndị mpịawa azụ dịka Tonto Dike

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.