HOTEL PRESIDENTIAL GA-ABỊAGHACHI ỌZỌ -UGWUANYỊ

Spread the love

Enugwu: Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyị ekwela ndị ọma ndị Enugwu Steeti nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ eleghị anya n’azụ ịhụ na Hotel Presidential, Enugwu bịaghachitere ọzọ.

Ugwuanyị kwupụtara nkea ụbọchị Tọọzdee  abalị iri n’asatọ nke ọnwa a mgbe ọ gara njem ijiri anya ya were hụ ọnọdụ Hotel Presidential bụ ụlọ nkwari akụ so n’akara ala(land mark) Enugwu.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na okwu banyere Hotel Presidential, Enugwu ka nọ n’ụlọ ikpe mana Ugwuanyị dịka onye mara ihe na-akpa ndị ọ na-achị na-esochizi ya bụ okwu ụlọikpe azụ iji mee ka o bee ọsịsọ ka ọrụ idozi ya bụ ụlọ nkwari akụ na-ewu ewu were biri ọkụ.

N’okwu ọ gwara ndị ọrụ o zutere n’ogige ya bụ ụlọ nkwari akụ, Gọvanọ Ugwuanyị kwara arịrị maka ajọ ọnọdụ ụlọ nkwari ahụ.

“Ọ dị mwute bụ ọnọdụ Hotel Presidential, Enugwu nọzị. A gaghị m anọ mbọ Nna anyị Michael Iheọnụkara Ọkpara bụ onye rụrụ ebea mgbe ọ bụ Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ alaa n’iyi.

” A na m ekwe ndị Enugwu nkwa na site n’ike nke Chukwu ọkpụkpụ nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, Hotel Presidential ga-abịaghachikwa ọzọ”

Ndị Enugwu hoo!haa!! gbara ajụjụ ọnụ gosipụtara obi ụtọ ha ma rịọkwaa Ugwuanyi ka o jide ka o ji.

N’okwu nke ya, Dọkịnta Maịk Ụzọigwe bụ onye ọkachamara n’okwu mmepe obodo kwuru sị:” Dịka nwa-afọ Enugwu Steeti, obi dị m ụtọ na Gọvanọ anyị na-ekwu okwu idozi Hotel Presidential. Ihe m na-arịọzi bụ ka a gbaa mbọ nyefee ya n’aka ndị ilekọta ụlọ nkwari akụ doro anya etu Gọọmenti Rivas siri mee Hotel Presidential, Pọt Hakọọtụ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.