Pọt Haakọt: Alahaji Asarị Dọkụbọ, onye ndu otu ọlụọ ọlaa Niger Delta Peoples Volunteer Force (NDPVF) ekwuola hoo!haa! na ọbịbịa mba Biafra adịwo nso. O kwuru nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ na Pọt Haakọt. Nwoke a bụbu onye ọ lụọ ọ laa sịrị na nkea bụ makaRead More →

Katsina: Gọvanọ Katsina Steeti, Alahaji Aminu Bello Masari, nọrọ ụbọchị Tọọzdee nwee ọgbakọ n’etiti ya na ndị ekperime na-awakpo ndị mmadụ n’Okpuru Ọchịchị asatọ nọ na steeti ahụ iji kwụsị ntọrị na steeti ahụ. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ gụnyere ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa dị iche iche na steetiRead More →

Kano: Gọvanọ chịburu Kano Steeti,  Mallam Ibrahim Shekarau agwala Gọvanọ Ezenwọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti na ọ bụ agha ka ọ chọrọ maka itikpọ ụlọ ekpere ndị Alakụba na Pọt Haakọt. Shekarau kwuru nkea n’ụtụtụ taa bụ Fraịdee ka ọ na-akatọ ntikpọ Gọọmenti Rivas Steeti tikpọrọ ụlọ ekpere ndịRead More →

Owere: Ichie Jaspa Ndụbụakụ, Onyeisi oche otu aka ọkụ Gọọmenti Imo Steeti guzobere maka Mweghachi Akụnụba Gọọmenti steeti ahụ ka ndị akpụ obi tiri eti eti, gbaa egbe ma gbukwaa mma ugboro ugboro.  Nkea kpọtụrụ ụnyahụ bụ Tọọzdee n’Owere oge nwoke a kajara aka duuru ndị otu ya ndị sikwaraRead More →

Phyno, odogwu na eti egwu, ezigbo aha ya bụ Chibụzọ Azụbụike ka ejima ya rịọrọ ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka ma “tinyekwa ya n’ihe a na-eme” Ejima ya nkea aha ya bụ Nnọlị Ụzọdịmma bụ onye Ojoto dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili n’Anambara Steeti. Ọ bụkwa onye nche ogbe(vigilante)Read More →

Enugwu: Ewepuwo Kọmishọna ndị Uwe Ojii Enugwu Steeti bụ Suleiman Balarabe.  Nkea bụ maka mkpesa si n’aka ọtụtụ ndịsonwere Steeti ahụ, na ya bụ nwoke enweghị ihe ọ na-eme maka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na steeti ahụ. Otu jikọtara ụmụ akwụkwọ bụ National Association of Nigerian Students (NANS) ngalabaRead More →

… Onye tikpọzịrị?  Pọt Haakọt: N’abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọọst, ka e tikporo ụlọ ekpere Alakụba dị na Rainbow na mpaghara Trans-Amadi nke ndị Alakụba na Rivas Steeti na-ekwu na-aka Gọọmenti Steeti ahụ dị na ya.  N’agbanyeghị na Gọọmenti Steeti ahụ sịrị na ihe ahụ akụkọ asị, ụfọdụ gakwaraRead More →

… Sọọsọ Mazị Ivans ka a kpụpụworo ụlọ ikpe Abụja: Otu na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ a na-akpọ Human Rights Writers Association of Nigeria, HURIWA, ekwuola na ndi uwe ojii Naịjiriya nọ sọọsọ na-egosipụta ndị ekperime ndị Fulani ha jidere n’achọghị ịkpụpụ ha ụlọ ikpe.  N’ozi nke Ịmanuel Ọnwụbiko, OnyeRead More →

Enugwu: Onye jibụ ọkwa dịka Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu ekwuola na sọọsọ nkesa usoro nchekwa bụ ọgwụ dịịrị nsogbu nchekwa na Naịjiriya. Ike Ekweremadu kwuru nkea ụnyahụ, oge ndị otu ụmụ nwanyị bụ ndị nta akụkọ bụ  Nigeria Association of Women Journalist (NAWOJ), ngalaba Enugwu Steeti bịaraRead More →

Gọọmenti Etiti Naịjiriya azọọla mbá imesi Ome ka Nwanyị, Okuneye Idris Olarenwaju, onye a maara dị ka Bobrisky ike. Onye Nlekọta Ukwu, ụlọ ọrụ National Council for Arts and Culture, Otunba Olusegun Runsewe, kwuru nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ “Bobrisky bụ ihere dịịrị ala anyị. O jiriRead More →

Otunba Olusegun Runsewe Onye Nlekọta ukwu nke ụlọ ọrụ National Council for Arts and Culture, ekwuwo na mmemme  ‘Big Brother Naiija Reality Show’ na-anata iwe Gọọmenti Etiti n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na ndị nhazi ya agbanweghị ihe a na-eme n’ime ya.  Runsewe gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ naRead More →

Legọs: Ọkachamara n’okwu banyere mkpofu ngwa latrik abaghịzị uru, Dọkịnta Ifeanyị Ọchọnọgọ enyela ụmụ amaala Naịjiriya ịdọ aka ná ntị banyere iji (usage) nakwa mkpofu bọlbụ latrik ọgbara ọhụrụ ‘Energy Saving bulb’.  O kwuru na mmiri mmụọ ( chemical ) na-ebute ọrịa cancer nke nọ ya n’ime. N’okwu ọ gwaraRead More →

Ka a na-eti mkpu mwakpo ndị IPOB wakporo onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu na Nuremberg, mba Jamani, onye ndu IPOB, Mazị Nnamdị Kanụ enyekwala ụmụazụ ya ntuziaka ịwakpo ma nwụchikọọ Onyeisiala Naịjiriya bụ Muhammadu Buhari na njem ọ na-abịa na mba Japan.Read More →

Enugu: Ngosipụta akwụkwọ Polo Mall, Enugwu na-aga n’ihu ugbua n’ogige Polo  Mall (Polo Park), GRA, Enugwu. Site n’okwu Mazị Uche Anịoke, otu onye n’ime ndị nhazi ya bụ ngosipụta akwụkwọ ahụ, nke a bụ nke anọ a na-eme ya bụ mmemme. Anịoke bụ onye ọrụ mbipụta akwụkwọ (publisher) a maraRead More →