ASABA:NDỊ OHI EZUWO NDỊ UWE OJII OHI

Spread the love

Asaba: Ndi oji  egbe ezu agawo ohi n’ụsụụ ndị uwe ojii a kpọrọ “B Police Barracks” n’ogologo ụzọ awara awara Bini-Ọnịcha n’Asaba, Delta Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ndị ohi a gbadozịrị ụkwụ na ọkụ adịghị n’ebe ahụ maka ìgwè ndọtu ọkụ (transformer) mebiri kemgbe ọnwa abụọ.

“Kemgbe ahụ ndị oji egbe ezu na-abịazị ezu anyị ohi ebea” ka onye bi ebe ahụ kwuru

O kwukwara na ha na-esi n’ọhịa dị n’azụ ebe ahụ amabata.

Onye ọzọ bi ebe ahụ kọwara na ọ gafeela otu ọnwa ha nile jiri tụọ puku Naira atọ atọ maka iji mezi ọkụ ha mana “otu abụghị na-ezi”

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/14/asabaonye-dpo-a-tooro-akwuola-n3m-ego-mgbaputa/

Ha rịọ ịrị kọmishọna ndị Uwe ojii na steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

Kaosiladi, Adeyinka Adeleke,Kọmishọna ndị Uwe ojii na steeti ahụ kọwara okwu maka ndị ohi ịbịa ebea ahụ dịka okwu n’enweghị isi mana ọ kwetara na ọkụ adịghị ebe ahụ kemgbe.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.