MWEGHARA AKỤNỤBA:NWAOBOSHI ARỊỌLA ỤLỌIKPE KA Ọ KAGBUO YA

Spread the love

Abụja: Sinetọ Pita Peter Nwaoboshi(Delta Mgbago Ugwu) nọrọ ụnyahụ, gbaa akwụkwọ n’Ụlọikpe Etiti dị n’Abụja iji kagbuo ikike o nyeburu ka Gọọmenti Etiti weghara akụnụba ya. 

Nkea bụ maka ikike mweghara akụnụba nke Ọkaikpe Taiwo Taiwo, nyere n’abalị ise nke ọnwa Julayị, inye ya ma ọ bụ onye ọbụla nwe akụnụba ndị ahụ abalị iri atọ ido ụlọikpe ahụ anya n’ihe mere Gọọmenti Naịjiriya agaghị eji weghara ha.

Otu aka ọkụ a kpọrọ  Special Presidential Investigation Panel on the Recovery of Public Property (SPIP) ka wegharagoduru ụlọ ndị a sị bụ nke Nwaoboshi’s nwa oge.

Ọkaiwu na anọchiteanya Sinetọ ahụ, Robert Clarke, SAN, rịọrọ ụlọikpe ka ọ kagbuo mkpebi mbụ ahụ.

Mazị Taiwo, yigharịrị okwu ahụ ruo abalị iri n’itolu nke ọnwa Ọgọọst, sịrị na nke ahụ ji nye madụ nile ohere itinye akwụkwọ nile kwesịrị ekwesị maka ịhụ na-enwere ikpe nkwụmọtọ.

Na mbụ ụlọikpe ahụ nyeburu ikike mweghara ụlọ iri n’anọ nakwa ọdọ ego ụlọ akụ (bank accounts) iri abụọ n’abụọ gbasara Nwaoboshi.

Ọdọ ego ụlọ akụ ndị ahụ nọgasi n’ụlọ akụ Zenith, UBA, Access na Sterling.

Okoi Obono-Obla,Onyeisi oche otu aka ọkụ ahụ nọzị na nsogbu ugbua maka ebubo inwe asambodo adigboroja nakwa iri ngarị, nọrọ n’abalị iri n’anọ nke ọnwa Julayị, weghara ụlọ nakwa ọdọ ego ụlọ akụ ndị ahụ.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.