ONYE KEKE EZIGBO MMADỤ NA-EWEGHACHI IHE E CHEFURU NA KEKE YA

Spread the love

Asaba: Onye keke akpaala agwa kwesiri nṅomi site na iweghachi ihe e chezọrọ na keke ya.

Onye chefuru ihe na keke bụkwa Mazị Jemis Oparaekeocha, onye nta akụkọ na-arụ n’ụlọ mgbasa ozi NTA, Enugwu

Onye nta akụkọ anyị gara gbaa ya ajụjụ ọnụ iji mee ka ụmụ amaala Naịjiriya ndị ọzọ, ọ kacha ndị ntorobịa ṅomie ya.

hoo!haa!! Biko, gwa anyị aha gị

Onye Keke: Aha m bụ Kọlins Abiya

hoo!haa!! : Ị bụ onye ebee

Onye Keke: A bụ m onye Mgbago Ugwu Ughelli

hoo!haa!!: Ya bụ na ị bụ onye Urobo

Onye Keke: Ee, mana nne m bụ onye Ndokwa. Ya mere m ji anụtụ Igbo

hoo!haa!!: Kedu ebe i si bute ya?

Onye Keke: E si m njegba ụzọ (junction) SLOT buga ya Ọgbogonogo.

hoo!haa!!: Kedụ ihe dịgasị n’akpa ahụ?

Onye Keke: Ekwentị I Pad Samsung, kaadị ndọrọ ego ATM abụọ na ihe ndị ọzọ

hoo!haa!!: Kedụ ka ị siri nwetazịa onye ahụ chefuru ihe na keke gị?

Onye Keke: E lelere m akpa ya, hụ mpempe akwụkwọ e dere akara ekwentị na ya. Oge m kpọrọ aka ekwentị ahụ, otu nwanyị zara ya m wee gwa ya ihe merenụ. E nyeziri m ya akara ekwentị nke m.

( o cheturu)

Oge nwoke ahụ bịara, a jụrụ m ya aha ụlọ akụ ndị nwe kaadị ndọrọ ego (ATM) ndị ahụ

hoo!haa!!: Nwanne m, a hụrụ m ebe ị dere Injinia n’aha gị na whatsapp. Ya, ị gụrụ mahadum

Onye Keke: Eheenụ

hoo!haa!!: Kedu mahadum ọ bụ ?

Onye Keke: Federal Polytechnic, Auchi

hoo!haa!!:Gịnị ka ị gụrụ?

Onye Keke: Civil Engineering

hoo!haa!!: Keduzi ihe mere i ji agba keke?

Onye Keke: Ọrụ adịghị, mmadụ gụchara akwụkwọ pụta, a hụghị ọrụ. Mmadụ ji  nke a enyere onwe ya aka mana o nwekwara ebe m na-arụkwa obere ọrụ were na-achọkwa ọrụ

hoo!haa!!: Hmm, ị lụwo nwanyị?

Onye Keke: A ka m na-achọ ịlụ. Agbam akwụkwọ m na-abịa n’ọnwa ọzọ

hoo!haa!!: N’ebee?

Onye Keke: Na Legọs

hoo!haa!!: Turu ugo, ọ bụrụ ebe dị nsọ, anyị kara ịbịa nọnyere gị maka na udiri mmadụ gị e bụghị ibu na Naịjiriya

Onye Keke: Daalụ, nna anyị ukwu

hoo!haa!!:  Nwanne m , kedu ihe  mere iji weghachite ihe ndị ahụ na-efu efu?

Onye Keke: EeOzigbo m hụrụ ya, m sị…, nke a bụghịkwa mbụ m na-eweghachi ihe mmadụ. E weghachiwo m ihe otu a ugboro atọ ugbua. E nwere onye nke chefukwara akpa ya. Onye nke ahụ sị na ya bụ ọsụ akwa(Laundry man).

hoo!haa!!: Mhmm

Onye Keke: E lelekwara m hụ SIM kaadị na-akpa ya m jiri kpọọ ya. Nke a kwa, a hụrụ m SIM kaadị Airtel n’akpa ya. E tinyere m ya n’ekwentị m mana ọ gaghị. A chọburu m iji ya mara ma o nwere onye m ga-enweta.

hoo!haa!!: Ee

Onye Keke: A chọburu m iji ya were chọta onye nwe akpa ahụ.

(o chetụrụ)

A gaghị m ewe ihe mmadụ, kedu ihe m ji ya eme. O nweghị isi. Kedụ uru ọ ga-abara m? M weregodu ego mmadụ, m ga-eji ya mee gịnị? Ọ ga-agwụkwarị. Ọ kwa ọ karịchaa, m were ya ṅụọ mmanya. Onye ahụ nwere ike bụọ gị ọnụ, abụm ọnụ ahụ ka nwere ike mezuo n’ọdịnihu. Yaa, anaghị m eme otu ahụ, e sighị otu ahụ zụọ m.

hoo!haa!!: Ekele dịrị Chukwu

Onye Keke: Ee

hoo!haa!!: Ya bụ, kedurii ihe bụ ebumnobi gị i jiri kpaa udiri ezigbo agwa a?

Onye Keke: ọ inyeghachi ya ihe ndị ahụ?

hoo!haa!!: Ee

Onye Keke: O nweghị, ọ udiri mmadụ m bụ

hoo!haa!!: Ọ nnọ̀ọ̀ akparamagwa gị?

Onye Keke: Ee, mmụọ m agaghị ekwe m iwe ihe n’abughi nke m.

hoo!haa!!: Chai

Onye Keke: A zulitere m n’ezinụlọ ndị otu Kristi. Mmụọ m agaghị ekwe m. Nkea bụ eziokwu.

hoo!haa!!:  Ngwanụ, Chukwu gọzie gị.

Onye Keke: Daalụ, nna anyị ukwu

Nkea gosiri na-aka nwere ezigbo mmadụ n’obodo a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.