OTU KEGITE, IMT EMEELA NGAGHARỊ MEGIDE MPỤ

Spread the love

Enugwu: Ndi Otu Kegite nke IMT, Enugwu nọrọ ụbọchị Wenezdee gbagharịa gburugburu mahadum ahụ ịgbasa ozi megide mpụ dị iche iche.

Ka ha na-agagharị, ha na-agụ egwu dị iche iche eji mara ndị otu ahụ bụ egwu “gyration”

Mazị Ifeakandụ Vitalis Udoye bụ Chiefo, ya bụ onyeisi otu Kegite na mahadum ahụ. Aha e ji mara Kegite ngalaba IMT bụ Ilya Tawinjin.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ahụ, chiefo ahụ kọwara sị, ” Anyị na-agbasa ozi megide mpụ dị iche iche dịka ịṅụ anwụrụ ike, ime Ntapu Ule, iso otu nzuzo, wdg.

O kwukwara na ha ji oge ahụ agbasakwa ozi maka mmemme echichi onye ọhụrụ ga-abụzị Chiefo Kegite na IMT nke na-abịa n’ụbọchị Satọdee izu ụka a.

Chief de Continuity ka-esi akpọ ya kọwakwara na Kegite abụghi otu nzuzo. Kama na ha na-akwalite omenala ndị Afrịka ma  na-emegidekwa mpụ dị iche iche n’etiti ndị ntorobịa.

Mazị Udoye kọwakwara na ya nọzị agba nke ikpeazụ (HND II) na ngalaba agụmakwụkwọ Nkanụzụ ndị na-ahụ maka Ọku Latrik na  Nzikọrita ozi(Electrical/Electronics Engineering Department)

Onye nta akụkọ anyị hụkwara na ma nwoke ma nwanyị so na ya bụ otu.

Edemede dị n’ụfọdụ ọkọrọtọ mgbasa ozi(banner) ha bu kwuru dị;  “Jụnụ Otu Nzuzo” “Jụnụ Ime Ntapu Ule” “Jụnụ Idina Nwanyị n’ike” “Jụnụ Mmadụ Igbu Onwe Ya”, “Ṅụọ Nkwụ ọcha nwee obi ụtọ”, wdg.

O mekwara ka o doo anya na otu Kegite bụ otu na-eme ka obodo dị mma.

N’afọ 1986, na mahadum Ọbafemi Awolowo, Ife, Ọshụn Steeti ka Mazị Antoni Ụzọdịmma Ogidi nọrọ bido otu ahụ. N’ihi nkea, ọ bụ ya ji ọkwa dịka Archival Chief nke Ilya du World. Nke a gosiri na ya bụ mahadum bụ isi ụlọ ọrụ otu a.

1 Comment

  1. Ndi otu kegite nka emeela nke oma n’ izisa ozi nka




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.