E JIDEWO NDỊ ASỊ GBURU FADA OFU

Spread the love

…Ụkọchukwu ọzọ zọrọ ndụ ya azọ n’aka ndị mwakpo ndị Fulani 

Enugwu: Ndi Uwe Ojii nọ n’Enugwu Steeti ejidewo ma gbakwaa n’anwụ ndị asị gburu Fada, Pọl Ofu, onye ogbugbu ya n’akụkụ Ọ̀gwụ̀ na mbido ọnwa a butere nnukwu nsogbu.

Ka ọ na-egosipụta ndị ekperime ahụ a na-enyo enyo dị iri atọ tinyekwara ndị gburu Fada Ofu, Kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Enugwu Steeti bụ Mazi Suleiman Balarabe kọwara na ha ewepụtala atụmatụ iji na-echekwa ndị ụkọchukwu maka udiri mwakpo ahụ.

Ndị ekperime  ahụ egosipụtara gụnyere Ibrahim Adamu, (25) si Taraba Steeti na Idris Tobe (28) tinyere mmadụ atọ ndị e jidebeghi, ndị gburu Fada Ofu.

Na ntọrị Igwe Sọnde Ọjị nke Ụmụ Obom-Agbogwugwu na Lọlọ ya, kọmishọna ahụ sịrị na mmadụ atọ n’ime ndị ahụ e jidere bụ Garba Basulugu, Mohammed Lagu na Mojunpan Duna ka aka ha dị na ya.

N’okwu ya, otu onye n’ime ndị ekperime ahụ, Ibrahim Adamu sịrị na ya bịara Enugwu ịchị ehi tupu ya banyezia n’otu ndị omekome ahụ.

N’otu aka ahụ kwa, ụkọchukwu ọzọ, Fada Chimezie Ani zọrọ ndụ ya azọ n’aka ndị Fulani na mgbede ụnyahụ.

Nkea mere n’akụkụ Mahadum Caritas, Ugwuọmụ-Nike. E jiri mgbọ gbasaa ugegbe ihu (windscreen) ụgbọala SUV ya na-acha mmee mmee mana o ji azụ gbatee aka were gbalaga.

hoo!haa!! nwere olileanya na Ụka Katọliki, ndị e gburu ụkọchukwu ha ga-esochi okwu ahụ azụ ka ọ hapụ ịdị ka nke Ukpabi-Nimbo.

N’agbanyeghị na ndị e jidere na nke ahụ kwupụtara arụ ha kpara tinyekwara ihe akaebe gụnyere onyonyoo ọchụ ha gburu, ha sere n’onwe ha, o nweghizi ihe e mere banyere okwu ahụ ruo taa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.