GỌỌMENTI EKITI AMALITEWO ATỤMATỤ ỊGBA NDỊ MWAKPO AKWAMIKO N’ANWỤ

Spread the love

Ado-Ekiti: Gọọmenti Ekiti Steeti amalitewo atụmatụ Ịgba n’anwụ ndị Atụrụ nga maka mwakpo akwamiko megide ụmụaka n’ụmụ nwanyị.

Ọkaikpe Ukwu nakwa Kọmishọna na-ahụ maka Ikpe Nkwụmọtọ na steeti ahụ, Olawale Fapohunda eweputebuola ozi n’afọ banyere ụzọ dị irè isi belata mwakpo akwamiko na steeti ahụ.

O kwuru sị, “oke ọnụ ọgụgụ nke mwakpo akwamiko na-ewute Gọọmenti steeti a. N’ihi ya, ọ dịzị mkpa iwepụta atụmatụ dị irè nke ga-ebelata ajọ ọnọdụ a. Otu n’ime ya bụ ịna egosi onyonyoo ndị atụrụ nga maka arụrụ ala a n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi Ekiti State Broadcasting Service tinyekwara ịkpọ aha ha na redio dị iche iche dị na steeti a”

O kwuru na ha amalitewo atụmatụ ahụ n’isi Ụkọchukwu  Asateru Gabriel, ụkọchukwu ndị Anglikan a chụrụ achụ, onye wakporo nwatakịrị nwanyị dị afọ asaa mwakpo akwamiko ma bụrụkwa onye a tụrụ nga afọ ise nọ n’ụlọ nga Gọọmenti Etiti dị n’Ado Ekiti.

Atụmatụ ndị ọzọ Fapohunda gụpụtara gụnyere:

i.Imado onyonyoo ndị a tụrụ nga maka mwakpo akwamiko n’ebe mgbakọ ọhaneze nile dị n’obodo ha nakwa Okpuru Ọchịchị ha.

ii. Ide akwụkwọ degara eze ọdịnala obodo onye ahụ si banyere arụrụ ala onye ahụ rụrụ.

iii. Itinye onyonyoo onye ahụ n’ọba ozi nke Mịnịstrị ahụ

Hmm, nkea dịkwa mma mana ụfọdụ ghara iji ihere sitere n’udiri ntaramahụhụ a kwụgbuo onwe ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.