HMM! NWA MAHADUM NA-EBUGHARỊ ZOBO

Spread the love

 

Otu agbọghọ igbo egosiputago na ihe ejiri mara ndị igbo bu igba mbọ. Ya bu nwa ada bu nwata akwụkwọ mahadum nke Benin, onye aha bu Okojie Lydia. Gịnị ka nwa-ada a mere?

Ya bụ nwa-ada, n’agbanyeghị mma ya so nne ya na-ebugharị mmanya ọtọbịrịbịrị a na-akpọ Zobo na ahịa dị na Benin iji si na ya nweta ego eji akwụ ụgwọ akwụkwọ ya na mahadum.

Ya bu àgwà bu ezigbo àgwà nwata nwanyị ọ bụla kwesịrị iṅomi ma ghara ịdị na ere ahụ ha ka ha were nweta ego ụgwọ akwụkwọ. Ndị hụrụ nwata nwanyị a ka ọ na-ele ya bu ihe, ọ gbara ha ghari n’ihi na nwada ada ma akwụkwọ ma nadi ọcha, ebe ụfọdụ chere na o si be nnukwu ọgaranya.

Ya bu àgwà kwesịrị nṅomi, hoo!haa! Ụmụ nwanyị anyị biko gbawanụ mbọ, unu atụkwasila mmadụ obi unu. Igbo na- agba mbọ, Igbo Amaka. Igbo ga-adi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.