KANỤ NWANKWỌ ETOOLA OBIANỌ MAKA IKWADO NDỊ GBAGBURU RANGERS BỌL

Spread the love

Ọka: Kanụ Nwankwọ, nwa-afọ Naịjiriya bụ ọka ibe n’egwu bọl Etoola Gọvanọ Wili Obianọ nke Anambara Steeti maka anya ọ na-eleta ndị ochie dike ndị mbụ gbaburu otu egwu bọl Rangers nke Enugwu bọl, ọtụtụ n’ime ha akaala ma nọkwara n’ọrịa.

N’okwu ya oge ọ bịara  gọvanọ ahụ njem mkpọtụrụ n’Agụleri, Kanu sị na obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu n’ihi etu Obianọ siri tinye mmụọ ya n’ilekọta ndị mbụ a gbaara Rangers bọl, ndị tinyere mmụọ gbaa bọl iji weghachite aha  Ndigbo oge alụchara agha.

Kanu kwupụtara afọ ojuju ya ebe Obianọ nọ maka ọgọ a ọ mere ndị ochie dike ndị ahụ kaworo nka.

“A na m arịọ ndị Gọvanọ ndị ọzọ ka ha ñomie Obianọ. O gosiwo ihe a tụrụ anya ya n’aka ezigbo onye ọchịchị”

Kanu to kwara  Obiano maka ọmalincha ọrụ ya n’Anambara Steeti ma kwuo sị, “Anyị ji gị eme ọnụ”

Odogwu egwu bọl ahụ kọwara na ya na gọvanọ ahụ dịbu na mma kemgbe ọ na-arụbu n’ụlọ akụ.

Kemgbe ọ batara n’ọkwa, Gọvanọ Obianọ na-akwụ ndị mbụ nile gbaara Rangers bọl ụgwọ ọnwa ma na-akwụkwa ụgwọ ilekọta ahụike ha. 

Iji gosipụta obi ụtọ ya, odogwu ahụ gbaburu ndị otu egwu bọl Super Eagles ala anyị chinyere Obianọ uwe ndị bọl ala anyị ma kwuo sị, “o kwesịrị inweta uwe No. 1 maka ọmalincha ọrụ ya dịka gọvanọ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.