A NWAKWALA ANYỊ! , ỤMAHỊ GWARA NNAMDI KANỤ

Spread the love

…ndi IPOB wakpo onye Igbo ọbụla ọzọ ndi Gọvanọ ga-akpụlata ya Naijiria ka ọhụ ihe ọkụ ji ntị oke eme

Abakaliki: Gọvanọ Dave Nweze Ụmahị nke Ebọnyị Steeti adọọla onyeisi otu IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanụ aka na ntị ka “ọ kwụsị ịyị ara” 

N’ozi odeakwụkwọ mgbasa ozi ya, Jems Eze tinyere aka ụnyahụ bụ Wenezdee n’aha ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Ụmahị gwara Kanụ sị:

“O nwere onye mpaghara Ọwụwa ọzọ awakporo ebe ọbụla n’ụwa nile, anyị ga-eji ụzọ ọbụla anyị nwere ike were hụ na-agbara Kanụ ụgbọ nwa mkpi, kpụlata ya Naịjiriya ka o zute iwe ndị be anyị”

Ụmahị kwuru na akparamagwa ọjọọ ndị IPOB kwara site na ịwakpo otu onye Igbo ji eme ọnụ, Sinetọ Ike Ekweremadu wutere ha nke ukwuu.

O kwukwara na ha na-ebechitere ndị IPOB akwa n’ihi na ha amaghị ihe ha mere site na ibuli nna ha elu, tie ya ukwu n’ala n’ọma ahịa.

Ọ kọwakwara mba IPOB na-azọ n’isi ndị gọvanọ dịka ịgba egbe ọnụ

“Anyị anụwo egbe ọnụ Mazị Nnamdị Kanụ( bụbu onye otu nkịtị na MASSOB) na-agba banyere ịwakpo ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ndị isi Ọhaneze Ndigbo tinyekwara ndị ọchịchị Ndigbo ndị ọzọ na ha akwadoghi nwoke ahụ chiri onwe ya eze na ọgụ ọ na-alụrụ onwe ya iji nweta ike ọchịchị ma butekwa ego ebe ọ na-eme ka ọ na-alụrụ Igbo ọgụ”

Ndị Gọvanọ takwara ụkwa jaara ya Kanụ eze site n’ime ka ọ mara na onye gburu nwanne ya abụghị dike, na IPOB dịka ndị bụ odogwu kwesịrị ịchụwa ndị Fulani ndị echi ehi ma n’Ala-Igbo mana mba ọbụla ha nọ, ebe ọ sị na IPOB gbanyere mgbọrọgwụ na mba ụwa ruru otu narị.

“Ọ bụrụ na Kanụ ma ihe ọ na-eme, ya dinye ndị IPOB ka ha buo agha buso ndị nchị ehi a si mba ofesi na mba ha sigasi bịa ebe ọ sị na IPOB nọ na mba ụwa karịrị otu narị.

Gụkwuo:  http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/21/ndorondoro-2023-butere-mwakpo-ekweremadu-mefo/

Ndị Gọvanọ a mekwara ka Kanụ mata na “a na-enwe obodo enwe”site na ichere ya aka mgba ka o duru ndị agha ya bata Ala-Igbo, ma obi kaa ya ịbịa lụọrọ Ndigbo ọgụ

” Kanụ lata, chịrị ndị agha ya dịka ọchịagha Biafra bịa kwaa mgbọ maka ala-eze ahụ na-agụ ya agụụ karịa ịkọ sọọsọ ọnụ”

Ha mechiri ozi ahụ site na ịgwa ya na ha ga-agbapu ya afọ, mee ka Ndigbo mata ihe ọ na-arụ, ma ọ kwanyeghiri onwe ya ugwu.

Igbo ndị ọma, ugo eberela na mgbagbu. Ntị na-anụ ihe, anaghị aha ka okpu ata. Ọma akwa asa ahụ mara onwe ya. O nweghi ihe dị Igbo ka ịdịnotu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.