ENUGWU:FULANI EGBUOLA MA BỌWAA AFỌ NWANYỊ DỊ IME

Spread the love

Enugwu: Ndi nchị ehi Fulani anyịwo. A na-ekwu ha arụ ha kpaburu ha darakwa nwanyị dị ime gbuo n’ụtụtụ a n’Enugwu, bewaa ya afọ wepụ nwa o bu n’afọ.

Nkea na-eme ka  ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka degachara onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi iji nye mkpesa maka mkpa mkpa ndị nchị ehi a na-akpa na mpaghara ahụ.

O rubeghi izu ụka atọ, ndị a gbagbukwara Fada Pọl Ofu, onye nke e liri n’izu ụka a.

Na Nchatancha Nike dị n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Enugwu.

Kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Enugwu Steeti bụ Suleman Balarabe kwuru na nkea mere n’ezie ma kwukwaa na ha na-esochi okwu ahụ azụ.

N’akwụkwọ ozi ha degaara Buhar ụbọchị Wenezdee, nke onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ tinyere aka, ha rịọrọ sị:”Ka Onyeisiala tinye aka ná mkpebi ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ịmachibido ndị nchị ehi iji ụkwụ achịgharị ehi na mpaghara anyị iji belata mwakpo, mbibi, idina nwanyị n’ike, ịtọ ndị be anyị tinyekwara imebisi ugbo nke ndị nchị ehi si mba ofesi nakwa ndị otu ha bụ ndị ala anyị.

“Anyị na-arịọ Onyeisiala ka anyị gbasaa ozi banyere akwụkwọ ozi a iji mee ka ndị be anyị ghọta na anyị agbachighi nkịtị maka nsogbu nchekwa nakwa akụnụba dị na be anyị ugbua, iji mekwaa ka ha mara na ndị ndu ha na-agbasi mbọ ike maka okwu nchekwa n’emeghi mkpọtụ ọbụla”

Ọzọkwa, Gọvanọ Ụmahi nọkwara ụnyahụ n’aha ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ sị” IPOB gaa buso ndị nchị ehi Fulani agha na mba ebe ha sigasị, ebe ọ bụ na IPOB sị na ha nọ na mba ụwa karịrị otu Narị karịa ịkọ sọọsọ ọnụ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.