ARỤ! NWANYỊ EJIRILA KOBOKO PỊAGBUO NWA YA DỊ AFỌ ANỌ

Spread the love

Akure: Arụ mere ụbọchị Wenezdee bụ abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Ọgọọst mgbe otu nwanyị jiri koboko were pịagbuo nwa ya nwanyị dị afọ anọ.

Site n’ozi ndị nta akụkọ anyị nwetara, nwanyị ahụ ku nwa ya ahụ gbata n’ụlọ ọgwụ mgbakwunye (annex) nke Mahadum Ondo Steeti dị n’Akure, n’ime abalị Wenezdee.

Oge ndị dibịa oyibo jiri nyochaa nwatakịrị ahụ, ha chọpụtara na ọ nwụọlarịị tupu nwanyị a kuru ya gbara bịa.

Ọzọkwa, mbọ nile ha gbazịrị iweghachi ndụ nwa ahụ lara n’iyi. Ha kọwaara na ọnyá ụtarị (koboko) juru nwatakịrị n’ahụ nwatakịrị ahụ nile.

Ozigbo nwanyị chọpụtara na nwatakịrị ahụ anwụnyụọla anya, o burukwara ozu ya mịpụ were gbalaga tupu ndị ụlọ ọgwụ amata ihe na-eme.

Otu nwanyị nọọsụ nọ ọrụ na ngalaba ihe ntụmadị ụmụaka ụlọ ọgwụ ahụ oge ihe ahụ mere kọwara sị:

“Ka anyị na-achọ ileru ahụike nwa ahụ anya, anyị chọpụtara na ọ nwụọlarịị.

Anyị hụkwara ọnyá ụtarị juru ya ahụ nile nke gosiri mmegide nwatakịrị (child abuse)

Nkea bụ n’ezie mmadụ iji ntaramahụhụ gbuo ọchụ.

Hmm, ụwa dịkwa egwu,hoo!haa!! Ndị amụtaghị nwa na-ebe, na-agbagharị n’ugwu n’agbọ, ebe ha na-achọ ọmụmụ. Onye Chukwu kunyezịrị nwa eweziri aka ya were ntaramahụhụ gbuo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.