… Ha mekwara mmemme ndula ụkọchukwu pụrụ apụ ya na nnabata ụkọchukwu nọzị ugbua.  Enugwu: Ụlọ ụka Katọliki Nne nke Enyemaka Ebeebe, New Haven, Enugwu nọrọ ụnyahụ rie oriri nke onye nsọ ụlọ ụka ahụ na-aza aha ya.  Ha jikwa ohere ahụ mee mmemme idula ụkọchukwu ochie ha, Fada KlementịRead More →

Abụja: Ndi ọrụ nchekwa DSS nọrọ ụnyahụ n’ọdụ ụgbọ elu mba ụwa Nnamdi Azịkiwe, Abụja kpụrụ Mazị Chido Ọnụma, maka iyi uwe edere ‘Anyị nile bụ ndị Bịafra’  ‘Anyị nile bụ ndị Bịafra’ bụ isi okwu akwụkwọ o dere nke nchịkọta edemede ya dị iche iche na-akwado Nhazigharị Usoro ỌchịchịRead More →

Abụja: Akachukwu Ọnyịuke, nwa Anambara Steeti ụbụrụ na-anụ ọkụ, onye detere A itoolu n’ule akwụkwọ WAEC nke ọnwa Mee/Juun afọ 2019 e cheerela aka mgba nye Odeakwụkwọ Ukwu ụlọ ọrụ JAMB, Ọkammụta Ishaq Oloyede ka ọ gbaa ya akwụkwọ ma ọ bụkwanụ o wepụta ihe ndete ya n’ule JAMB nkeRead More →

Kaduna –Alahaji Namadi Sambo, onye jibu ọkwa Osote Onyeisiala ka a na-atụ anya na ọ ga-abanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’oge na-adịghị anya. Sambo nọrọ ụbọchị Fraịdee na Kaduna were too Gọvanọ Steeti ahụ, Mallam Nasir El-Rufai maka ‘ọrụ ọma’ ya, ọ kacha ịrụtọpụ mbawanye usoro mmiri obodo Zarịya nkeRead More →

Enugwu: Otu nile na-achọ Biafra site n’usoro ụlọikpe na mkparịta ụka tinyekwara ndị nile ihe Biafra na-amasị ga-enwe ọgbakọ ukwu n’Enugwu n’abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Septemba. Nkea ga-enye Ọkaiwu Emeka Emekesiri ohere ịkọrọ ndị Bịafra ka ya na ihe si aga banyere akwụkwọ ọ gbara Gọọmenti Naịjiriya n’ahaRead More →

Abụja: Onyeisiala Muhammadu Buhari azọpụtala Mazị Festus Keyamo bụbu Mịnịsta nta na-ahụ maka Mpaghara Naịja Delta na arịrị ọ na-eri site na ịrụ ọrụ n’okpuru Sinetọ Godswil Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Mpaghara Naịja Delta site na iwegazị ya na mịnịstrị na-ahụ maka Ọrụ.  Tupu ugbua, Keyamo, dịka Ọkaiwu ndịRead More →

Igwe Ọcha: Maka ndị ọjọọ, ndị ogbu ọchụ na-atọgbuzi ụmụ nwanyị ha butere n’ụlọ  nkwari akụ nke na-ewuzi ugbua n’akụkụ Igwe ọcha (Pọt Haakọt), ụmụ akwụla nọ n’obodo ahụ echepụtala atụmatụ dị iche iche, iji zọọ onwe ha ndụ ma na-arụkwa ọrụ ha bụ ịzọpụta ụmụ nwoke ndị o jiRead More →

Site n’aka Sabastin Nwogwugwu-ọgwụ, Mịna Mịna: Onye bụbu Onyeisiala Naịjiriya n’ọchịchị ndị soja, Ọchịagha Ibrahim Badamasi Babangida, akpọ̀ọla òkù , maka mkpa ọ dị, ịkwalite ezi adị m na mma, n’etiti ụmụ Igbo na Ndị agbụrụ ọzọ dị iche iche enwere na ala anyị bụ Naịjiriya. Ọ bụ ụnyaahụ bụRead More →

Legọs –A kụwo otu ụkọchukwu chọrọ ịma nwanyị elu n’ike gwoo gwoo n’Ejigbo  Legọs. Ya bụ ụkọchukwu, Daniel David bịara ịchụ nwa agbọghọ aha ya Happiness ajọ mmụọ tupu o siri nkute ụtaba banyezie ime ahịa.  Ndị Uwe Ojii zọpụtara ya bụ ụkọchukwu dị iri afọ anọ n’aka ndị agbataRead More →

Enugwu: Nnukwu ọdachi dapụtara n’Enugwu oge otu obere nwa nwoke, Gọdwin Akpan dị afọ iri n’atọ tọgburu nwa nwoke ọzọ,Essien Nseobong dị afọ iri n’anọ ma kwanye ya n’ime mmiri ala. Nkea mere n’abalị mbụ nke ọnwa Septemba n’Ugbo Lọrịns bụ ógbè ndị o nweghị ka ọ ha dị naRead More →

… Ịbọrọ ọbọ maka ụlọ ụka Alakụba a siri na Gọọmenti Rivas Steeti tikpọrọ Kaduna: Otu Christian Association of Nigeria (CAN), ngalaba Kaduna Steeti akatoola ozi nkwapụ ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka mmepe obodo, Kaduna State Urban Planning Development Agency zigaara ụlọ ụka ndị Angịlịkan Onye Nsọ Jọọjị naRead More →

Kano: Ezigbo nsogbu dị na Kano ugbua maka na nne atụrụ dị ime mụziri ihe yiri mmadụ n’isi ụtụtụ taa bụ Tọọzdee.  Nwa atụrụ ahụ a mụrụ ọhụrụ nyere akụkụ ahụ dị ka nke mmadụ, ma isi, ma aka, ma ụkwụ. Onye jiri anya hụ ihe ịtụnanya ahụ dị na-awụRead More →

… IPOB adapụla n’ebumnobi Ikedife dịka onye soro hiwe ya.  Ọnịcha: Dọkịnta Nwabụeze Chris Ngige, Mịnịsta maka Ọrụ, ekwuola hoo!haa! na ndị IPOB enweghị ike iwakpo ya ma gaa mba ofesi. Ngige kọwara na nke a bụ maka na ya zụrụ ndị otu ahụ nri ma chekwakwaa ihe gbasara haRead More →

Harare, Zimbabwe: Ndi nhazi Mmemme  Mapopoma na Zimbabwe ewepụwo aha nwa Sawụt Afrịka na-ewu ewu n’agụm egwu bụ Babes Wodumo n’aha ndị ga-agụ egwu na mmemme ahụ maka na ọ na-akwado akpọmasị mbà(xenophobia). Babes Wodumo agaghịkwa esonye na mmemme ahụ a ga-eme n’ogige Victoria Falls Sports Club na Victoria Falls,Read More →

Abuja: Nkatọ sitere n’aka ọhaneze ka sochikwara akwụghi ndị otu egwuregwu Super Eagles ala anyị nakwa ndị nlekọta ha, ụgwọ nile nakwa ego mmachi akpa nile e kwesịrị ịkwụ ha, kemgbe ọnwa abụọ ha jiri gbata ndị nke atọ n’Asommpi Egwu Bọl mba Afrịka bụ AFCON n’agbanyeghị na Gọọmenti ewepụtalaRead More →