ỌGỤ OBASEKI N’OSHIOMOLE:OBASEKI ENWETALA NKWADO OONI

Spread the love

Bini: Ka ọgụ dị n’etiti Gọvanọ Edo Steeti, Gọdwin Obaseki ya na onye ọ nọchiri n’ọkwa ma bụrụkwa Onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’ala anyị, Adams Oshiomhole na-aga n’ihu, Ooni Ife, Oba Adeyeye Enitan Ogunwusi, Ojaja II, ákwàdowo Obaseki maka ọchịchị ya nke gbadoro ụkwụ n’ịkwalite ndụ ndị mmadụ, ma gharakwa ikwe ka mmadụ mee ka uche ya pụọ n’ọrụ mmepe Edo Steeti o ji n’aka.

Ooni, onye kwuru nkea ụbọchị Wenezdee ka ọ gara njem mkpọtụrụ n’obi Gọọmenti Edo Steeti na Bini, kwukwara na Gọvanọ ahụ kwesịrị inye nkwado zuru oke ka o were gaa n’ihu n’ọrụ ịgbanwe Edo Steeti.

Ọ gakwara n’ihu kwuo sị, “A m na ị na-etinye atụmatụ ndị ahụ ị jiri turu ugo mgbe ị na-elekọta ụlọ ọrụ nke gị n’ọrụ dịka Gọvanọ maka na ndị Edo Steeti tụrụ anya ka ị hapụ ezigbo ihe ncheta a ga-eji cheta gị”

Ooni gwakwara ya ndị eze ọdịnala kwesịrị inye ya ezigbo nkwado.

“Maka ọrụ ọma gị na steeti a, agbamume dịka njem a kwesịrị ị na-adị. Anyị na gị kwụ. Site n’ocheeze Oduduwa, nkea ka m nwere ịgwa gị”

Ọ gwakwara ya ka ọ gbado anya n’ihe ọ na-eme, n’ekweghị ka onye ọbụla mee ka uche ya pụọ n’ọrụ ọma o ji n’aka. 

Gọvanọ Obaseki kelere Ooni maka njem ya ahụ bụ adị nchefu ma kọwakwaa na onye eze ọdịnala ahụ so na ndị eze ọdịnala ihe ọma na-adị mma na Naịjiriya.

Obaseki kwukwara na Ooni bụ onye na-achọ udo n’ịdịnotu n’akụkụ ala anyị nile.

Leave a Reply

Your email address will not be published.