HMM! NWANYỊ ‘BANKER’ DINARA ỤMỤ NWOKE NARỊ ABỤỌ

Spread the love

Zambịya: Otu nwata nwanyị welitere isi n’ụlọ akụ abuworo onye a chụrụ maka idina ụmụ nwoke ruru narị abụọ, ndị o kwere nkwa ọrụ.

Mutale Winfridah, dị iri afọ atọ n’itolu, onye welitere isi n’ụlọ akụ ZANACO bank, ka ihe karịrị ụmụ nwoke iri dere akwụkwọ mkpesa megide, na-ebo ya ebubo iji ọkwa ya were ‘na-arata ha idina ya’ ka o kwechara ha nkwa ọrụ ma tinyekwa aka n’akwụkwọ ka ụlọ akụ nye ha ego mgbazinye.

Winfridah, ka e siri kwuo alụbeghi dị ebe ọ na-achọ inweta nzere mmụta dị iche iche tupu ọ lụọ dị.

Hmm, ụmụ nwoke a, emetaghịkwa ya. Nwanyị mmadụ dị ike ọrụ ‘o mere ọha’ metara ha nile mma, na anaghị ego ọbụla. Keduzi iwe ha? (Ọchị erie m ahụ) 

Leave a Reply

Your email address will not be published.