ISE IGBÓ:ỤLỌIKPE SHARỊYA ENYEWO MKPEBI ỊPỊA NWA AGBỌGHỌ ỌNỤ ỤTARỊ IRI ASATỌ

Spread the love

Kaduna: Ụlọikpe Sharịya na Magajin Gari, Kaduna, anọrọla ụnyahụ were maa nwa agbọghọ dị afọ iri n’itolu, Zainab Abdullahi, ịnata ọnụ ụtarị iri asatọ maka ise igbó n’ezi. 

Ọkaikpe Malam Muhammad Shehu-Adamu, kwuru na ihe ahụ bụ ihe dị n’iwu maka ịṅụ ihe na-aba n’anya(Hadd).

Ọ gwara otu Muslim Council of Nigeria ka ha jisike n’ọrụ ha ma gbaa mbọ tọghaa nwa agbọghọ ahụ.

Na mbụ, onye wetara okwu ahụ, Ibrahim Shuaibu, gwara ụlọikpe ahụ na ndị Uwe Ojii jidere  Zainab n’okporo ụzọ ka ọ na-aṅụ igbó.

Shuaibu kwukwara na Zainab ejebuola nga mbụ maka na ọ kwụnwụghi nha puku naira asaa ruo mgbe otu Muslim Council of Nigeria, kwụzịrị ya nha ahụ. 

Hmm, nke a bụkwa agbọghọ Boko Haram. Kedu ihe buteziri nwa agbọghọ ibi udiri ndụ a?

Leave a Reply

Your email address will not be published.