KANADA:AHỌPỤTAWO NWANYỊ ONYEIGBO KA ONYE OMEBEIWU

Spread the love

Kanada: Ahọpụtawo otu nwa-afọ Naịjiriya dị iri afọ atọ n’itolu, Ụzọma Asagwara,dịka onye Omebeiwu n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị New Democratic Party.

Asagwara, onye a mụrụ n’Imo steeti bụ otu n’ime ndị ojii mmadụ atọ ahọpụtara isonye n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nke Mpaghara  Manitoba.

Ọ rụrụ ọrụ afọ olemole dịka nọọsụ ndị isi adịghị mma ma bụrụkwa onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ na Winnipeg.

Ụzọma sịrị na ọ na-ekele mmadụ nile ndị kwadoro ya na ya bụ nhọpụta.

Asagwara abụghị sọọsọ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ. Ọ bụkwu onye asọmmpi egwuregwu(athlete) 

Hmm, Igbo, unu dị egwu oooo! Aka anaghị ekpuchi ọnwa. A na-egbu achara, ọ na-eto ogologo.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.