ỌTỤTỤ NDỊ GỌVANỌ PDP BỤ ‘NICODEMUS’ – WIKE

Spread the love

… A na m ekwu nke m hoo!haa!! E soghi m ndị Gọvanọ PDP ndị mere mere n’ihu, gwọmpiti n’azụ 

Igwe Ọcha: Gọvanọ Nyesom Ezenwo Wike akọwaala na ya zigara Onyeisiala Muhammadu Buhari ozi nturugo na mmeri ọ meriri n’Ụlọikpe Nhọpụta Onyeisiala maka na ọ ka mma ịpụta ihe zigara ya ozi ekele karịa iji abalị rịbanye ga hụ Buhari ka ‘Nicodemus’  

Wike sịrị na ọtụtụ ndị gọvanọ PDP bụ ndị mere mere n’ihu, gwọmpiti n’azụ mana na ozi nturugo ahụ si ya n’obi maka na ya na-ekwu hoo!haa!!

O kwuru nkea n’ụka elimozu Lọlọ Blesịnụ Awuse, nne Onha Sergent Chidi Awuse, n’ụlọ ụka Angịlịkan Onye dị nsọ Luuk, Emohua, Rivas Steeti  ụbọchị Tọọzdee.

O kwuru sị:”A ma m na ọ tụrụ unu n’anya na m kelere Buhari. Ọ kaghị mma ikele ya, karịa ịrịbanye be ya, ga hụ ya n’abalị?”

“Ọtụtụ ndị Gọvanọ PDP ji abalị aribanye aga ahụ Buhari. A gatụbeghi m, a gaghịkwa m aga”

“Onyeisiala Buhari, turu ugo ma weta ndị Naịjiriya nile nso. Jikọọ obodo a, nkewa karịrị n’obodo a. Ihe m na-ekwu ziri ezi. Ihe m ga-eme  ka m ga-eme. A gaghị eme nke m agaghị eme.

Gọvanọ Wike kọwara na ọ dị mwute na Rivas Steeti nwere ndị Steeti ahụ ha na Buhari na-arụkọ mana o nweghị ihe ọbụla Steeti ahụ na-erite n’aka ha. Ọ kwakwara arịrị na Rivas bụ sọọsọ Steeti Gọọmenti Etiti juworo inyeghachi ego o mefuru n’ịrụ ụzọ Gọọmenti Etiti dị na steeti ahụ. 

“Ndị a rere anyị, chee na ha na-emegbute Gọvanọ Wike. Ọ bụ Steeti  a ka ị na-emegide”

Chetakwa na Chubuike Amechi, Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ onye Steeti ahụ ma bụrụkwa onye ya na Wike nọ n’agha kemgbe.

Dịka Mịnịsta na-ahụ maka njem, Amechi emezibeghi ọdụ ụgbọ mmiri Ígwé ọcha nke o ji arụ ụzọ awara awara a kpọrọ ‘East West Road’

Bikonu  keduzi ndị  gọvanọ PDP ndị ahụ bụ ‘Nicodemus’? Onye ma aha ha?

Leave a Reply

Your email address will not be published.