ISI KARA ỊGBAKA M, MA Ọ BỤRỤ NA ATIKU MERIRI – BUHARỊ

Spread the love

Abụja: Onyeisiala Muhammadu Buharị ekelewo Chukwu maka ugo o tuuru n’Ụlọikpe Nhọpụta Onyeisiala ma kwukwaa na isi kaara ịgbaka ya ma ọ bụrụ na Alahaji Abụbaka Atiku nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP, onye gbara ya akwụkwọ meriri ya.

“E kelere m Chukwu maka nkea, ọ dị m’ ka isi akaara ịgbaka m ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ emee m. N’ihi ya, e were m uche m nile tinye n’akwụkwọ ozi ọrụ (memo) dịgasị m n’ihu. Nke mbụ bụ maka usoro mmefu ego(budget), o were m elekere ise. Ya bụ, ka unu ji elekere itoolu were na-eme ihe unu, anyị ji ihe dịka elekere asaa were na-eme nke anyị ebea.”

Okwu ndị a gosiri etu obi si koro Onyeisiala Buhari n’elu ka a na-agụpụta mkpebi ụlọikpe nhọpụta onyeisiala ụbọchị Wenezdee gara aga nke kwupụtara n’ezie na o meriri Abụbaka Atiku, onye mbuụzọ chere ya aka mgba na nhọpụta onyeisiala e mere n’abalị abụọ n’atọ nke ọnwa Febrụwarị afọ a.

Buharị kwuru nkea ụnyahụ oge ndị Gọvanọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị  All Progressives Congress (APC), kpọtụụrụ ya n’Asọ Rọk iji soro ya tụọ mmamma na mmeri ya.

Buhari kwukwara na mmeri ahụ bụ nke mmadụ nile ma rụtụkwa aka na ọ kakwaara ịmetụta ndị APC nile ma ọ bụrụ na mkpebi ikpe ahụ adabaghịrị ha.

Ọ kowakwara na ọ bụ ihe ndakọrịta dị ịtụ n’anya na Ọgbakọ Ọchịchị Etiti (Federal Executive Council) ala anyị na-aga n’ihu oge a na-agụpụta mkpebi ahụ.

N’okwu ya, Onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’ala anyị, Adams Oshiomhole kwuru na mkpebi ahụ bụ nke ” gaziri agazi ma dokwaa anya” iji wepụ mgbagwoju anya ọbụla maka asambodo onyeisiala.

“O nweghị mgbe anyị jiri nwee nkụja ọbụla. Obi kara anyị na mmeri bụ nkea anyị

“Matakwa na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC nile kwụ gị n’azụ chịm chịm”

Onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC, Alahaji Abụbaka Atiku Bagudu, Gọvanọ Kebbi Steeti weliiri onyeisiala aka elu maka mmeri ya n’Ụlọikpe nhọpụta ahụ, ma rụtụkwa aka na ichu uchu n’ọrụ nakwa mmụọ ife ala nna ya mere o jiri nọgide n’ọgbakọ ọchịchị etiti ala anyị (Federal Executive Council) ka a na-agụpụta mkpebi ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.