ENUGWU:NWA NGWỤRỌ KWERE MMADỤ N’AKA, IHE NWOKE YA KPỌNWỤỌ

Spread the love

Enugwu : Ndi Uwe Ojii Enugwu Steeti na-eme nnyocha banyere onye ngwụrọ kwere mmadụ n’aka ihe nwoke ya kpọnwụọ. 

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii n’Enugwu Steeti, Mazị Ebere Amaraizu kwuru nkea taa n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ.

Amaraizu sị na nkea mere ụbọchị Fraịdee na mpaghara Obiagụ dị n’Ogui, Enugwu oge otu nwoke aha ya bụ Sọnde kwere onye ngwụrọ bụ Anayọ n’aka.

“Sọnde, n’ụbọchị ahụ tikuru ọhaneze ndị nọ nso n’ebe ihe ahụ mere n’Obiagụ na ya kwere  mmadụ n’aka ihe nwoke ya kpọnwụọ.

” Ndị nọ nso ebe ahụ tiweziri Anayọ ihe ka ha tigbuo ya. Ọ bụzị ndị Uwe ojii si na ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Ogui Road zọrọ ya ndụ.

Amaraizu kọwara na ndị Uwe Ojii na-ele anya n’okwu ahụ iji chọpụta nke bụ eziokwu. 

Kaosiladi, ndị mmadụ hụtara ihe ahụ mere dịka aka ọrụ ndị ọgwụ ego.

Hmm, ọnwa mba eruola. Onye ọbụla mụrụ anya ka azụ

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.