Owere – Gọọmenti Imo Steeti e meela ka ikuzi Igbo bụrụ iwu n’ụlọ akwụkwọ nile nọ na steeti ahụ.  Kọmishọna Steeti ahụ na-ahụ maka Agụmakwụkwọ, Ọkammụta Viola Ọnwụ liri, kwuru nkea na mmemme nnabata ụmụ akwụkwọ ọhụrụ nke Kọleeji Imo Steeti na-ahụ maka ndị nọọsụ nakwa iji ime dị n’Ọ̀lụ̀.Read More →

Ụmụahịa – Mazị Nnamdị Kanụ, Onyeisi otu  Indigenous People of Biafra (IPOB), ajụọla ndị Eze Ọdịnala na-arịọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o nye ya mgbaghara iji mee ka ọ lọta, bịa lie nne ya onye dinyere ha.  Kanu kwuru sị, “E dinyeghi m onye ọbụla ịga rịọrọ m Gọọmenti Etiti,Read More →

Johanesbọg, Sawụt Afrịka: N’ụbọchị ụka, abalị atọ nke ọnwa Nọvemba, afọ 2019, Ezeali Ndubueze Jonas Udeji, Onowu Ndigbo, Sawụt Afrịka ga-eso na ndị ga-anata Onyinye Nkwanye Ugwu Influential Men of the Year, JHB 2019 Award. N’ụlọ ezumezu dị n’ogige nkiri anya Gold Reef City, Johanesbọg bụ ebe a ga-eme ya bụRead More →

Enugwu : Igwe Lọrịns Agụbụzụ, Eze Ọgbụnechendo nke mbụ n’Ezema Olo ekwupụtawo na ya ga- enye Onyinye Nkwanye Ugwu Ọdịnala pụrụ iche (Special traditional award) maka onye ga-arụpụta ngwa nro(application) Ọ̀gụ àfọ Igbo (Igbo Calender) n’ekwentị. Onye eze ọdịnala a bụkwa Onyeisi oche ndị eze ọdịnala n’Enugwu Steeti kwupụtara nkeaRead More →

–Ozi a si n’aka Ike Nibo Ọka–  Mmemme kachasị were ekpo ọku na Nibo bụ Oriri Ọnwa Asaa Nibo. Nibo bụ obodo dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Ọka.  E mere nke afọ a na ngwụcha ịzụ ụka gara aga. Mmọnwụ dị iche iche na ndị mmadụ jupụtara Nibo maka mmemmeRead More →

Owere  – Rt. Hon. Okey Onyekanma, Osote Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti akọwaala na Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti nakwa Gọọmenti Imo Steeti agaghị ekwelata ka asụsụ nwụọ. Onyekanma kwuru nkea ụbọchị Mọnde n’ụlọ ọrụ ya, oge ọ na-anabata otu nhazi maka ịmalite Oluigbo- Rediyo ọbaozi asụsụ IgboRead More →

Bọkịna Faso: Fabrice Zango, nwa afọ Bọkịna Faso na-awụ ‘triple jump’, enwetala ebili dị ka ihe nrite maka ịbụ nwa amala mba ahụ onye mbụ na-eturu ugo n’Asọmmpi Ịgba ọsọ Mba Ụwa e mepụrụ na Doha mba, mba UAE.  Zango, onye nwetara onyinye nturu ugo ọla ọkụ (bronze) na yaRead More →

Legọs: Onyonyoo nwata nwanyị gba ọtọ kwụrụ n’etiti ụzọ na-atamu jupụtara n’amaozi mkpakọrita(social media) dị iche iche. Ozi hoo!haa!! nwetara na-akọwa na ụgbọala kwụsịrị nwanyị ahụ ebe ahụ ma gbapụ n’ike tupu ndị mmadụ aghọta ihe na-eme oge o ji ọkara gafee elekere ise nke mgbede n’ebe Ajah, Legọs. OnyeRead More →

Kaduna Steeti –Nwoke dị iri afọ atọ n’ise, Ibrahim Adamu, nọrọ ụnyahụ kpụpụ ọgọ ya nwoke nakwa ọgọ ya nwanyị ụlọikpe Sharịya na Magajin Gari Shari’a, Kaduna Steeti, maka ịkwagbunyere ya nwa ha nwanyị dị ime ka ọ lụọ.  Onye a wetara mkpesa n’ihu ụlọikpe, onye bi n’obodo nta Rijjana,gwaraRead More →

Legọs: Afenifere, otu jikọtara ndị Yoroba nile akọwaala dịka ihe ihere bụ ọgbụgba ama  si n’aka ada Mamman Daura bụ Fatimah, na ezinụlọ ha bi ebi n’ime Asọ Rọk, kemgbe ihe karịrị afọ atọ.  Afenifere kọwara na ọ dị mwute bụ etu onye achọpụtaghi n’ọkwa siri wee kechikọọ Onyeisiala maRead More →

Otu ihe mere e jiri sie ọnwụ ka ọchịchị gafee na Mpaghara Mgbago Ugwu Anambara n’afọ 2013 bụ maka na mpaghara ahụ bụ ebe kacha kpere azụ na mmepe, n’agbanyeghị na ọ bụ ya bụ “aka na-enye Steeti ahụ nri” E weere na ọ bụrụ na ọchịchị laa ebe ahụ,Read More →

Ọnịcha: Njinji jiri taa n’Upper Iweka, Ọnịcha oge otu ụgbọala bu mmanu ụgbọala(petrol) gbara ọkụ.  Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ọkụ ahụ bidoro mgbe ya bu ụgbọala zọhiere ụkwụ, oge ọ na-achọ ịla azụ were dabanyezia n’ọwa mmiri(gutter) dị n’ebe ahụ. Mmanụ o bu wufuziri were soro ọwa mmiri ahụ gbasasịaRead More →

Enugwu: Ndi Gọvanọ na ndị ndu ndị ọzọ nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere ọgbakọ ụnyahụ n’Obi Gọọmenti, Enugwu were kpebie ịga hụ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ọdịmma ndị mpaghara ahụ.N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka e mechara ọgbakọ ahụ, Onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda (SouthRead More →

… Nkea bụ mbụ ọgbakọ a na-alọta Enugwu kemgbe Achebe hiwere otu ANA na Nsụka n’afọ 1981 Enugwu:Ndi Odeè si mba ụwa nile ga-ezukọta n’Enugwu Steeti, ebe a nọrọ mụọ otu jikọtara ndị Odeè na Naịjiriya bụ Association of Nigerian Authors (ANA), ka ọ gachara iri afọ atọ n’asatọ ochieRead More →

Ọnịcha: E jidela nwoke kere ekike ka ‘ndị Sista’ ụka Katọliki were zuru nwa mmadụ. Nke a mere n’ụbọchị Fraịdee n’Okpoko, ógbè  ndị Ogbenye n’Ọnịcha. Nwoke ahụ, ana achọpụtaghi aha ya, dịka akụkọ siri kọọ, banyere n’ụlọ ndị mmadụ, n’oge ehihie, ebe nile dara owu. N’ihi na e chere naRead More →

Ichie Frank Opigo, onye nyere mba Bịafra aha bụ onye Ịjọ, nwa-afọ Angiama nke nọ na Bayelsa Steeti taa. N’ụbọchị Satọdee, abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Mee, afọ 1967, e nwere Ọgbakọ ndị nnọchiteanya agbụrụ nile nakwa ọnụmara nile nọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya. Okwu a kpụ n’ọnụRead More →