ỌDỤ ỤGBỌELU ENUGWU GA-ADỊ TUPU EKEREMESI, MA EGO DỊ – SIRIKA

Spread the love

Abuja – Mịnịsta na-ahụ maka Njem Ụgbọelu, Mazị Hadi Siria nọrọ ụbọchị Tọọzdee kwuo na ọdụ ụgbọelu  Mba Ụwa Akanụ Ibiam, Enugwu ga-eri ijeri Naịra Iri iji malitekwa ọrụ ọzọ.

Siria kwuru nkea oge ọ na-agwa ndị Kọmitii na – ahụ maka njem ụgbọelu n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Nta Ala anyị okwu n’Abụja.

“Ego dị, anyị ga-arụchanwụ ya tupu ekeresimesi maka na anyị chọrọ ka ndị  na-ala ekeresimesi zute ọdụ ụgbọelu ọhụrụ ma ha lọta.

O kwukwara na ha ezigaworo Gọọmenti akwụkwọ maka Ijeri Naira Iri, na Gọọmenti na-agbakwa mbọ iweta ego ahụ.

“E mechiri ọdụ ụgbọ elu ahụ maka okwu nchekwa ndị njem. E mechiri ahịa nọ nso ebe ahụ nke na-ebute ụmụ nnụnụ nwere ike ibutere ụgbọ elu ihe mberede

” Okwu ọzọ bụkwa ka ndị obodo ọdụ ụgbọ elu ahụ dị si arunyezi ụlọ n’ala ọdụ ụgbọ elu ahụ.

Mịnịsta ahụ kọwara na-esechaala esere ese nke ụzọ mgbapụ ọsọ ụgbọelu (runway).

O kwukwara na dịka isi obodo mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, na ọdụ ụgbọelu Enugwu so n’ime ọdụ ụgbọelu ise Gọọmenti Etiti.

Na mbụ n’okwu ya, Onyeisi oche otu Kọmitii ahụ, Nnoli Nnaji, jụrụ Mịnịsta ahụ ihe ka ji ọdụ ụgbọelu ahụ. 

O kwuru na ọdụ ụgbọelu ahụ dị ndị mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ, Ndịda Ndịda nakwa akụkụ ụfọdụ n’ime Etiti Ugwu mkpa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.