ENUGWU: E MECHIWO NTACHI ỌSA, ỤLỌ ERIMERI KACHA EWU EWU

Spread the love

Enugwu:. Ntachi Ọsa, ụlọ erimeri kacha ewu ewu n’Enugwu ka ụlọ ọrụ Gọọmenti steeti ahụ na-ahụ maka Mmepe Isiobodo Steeti ahụ bụ Enugu Capital Territory Development Authority (ECDA) mechiri ụnyahụ.

Site na nchọpụta onye nta akụkọ anyị mere, a na-akọwa na ECDA mechiri ụlọ erimeri ahụ maka na ọ na-ebute nsogbu ụzọ mkpọchi n’akụkụ ebe ọ dị.

Nke bụ eziokwu bụ na ụlọ erimeri ahụ dịchiri ụzọ nke na o nweghị ohere ndọsa ụgbọala maka ndị ahịa ya.

N’okwu nke ya, otu onye na-abịa eri nri ebe ahụ, Onyeka Ọnụọha kwuru na etu e siri mechie ebe ahụ n’ike adịghị mma.

“Gọọmenti kwesịrị iji maka ndị o nyere ọrụ ruru mmadụ iri asaa were nyetukwuo ya ohere karịa imechi ebe ahụ n’ike.

“Ụtụtụ ahụ e jiri bịa imechi ya, ha esiwela erimeri a ga-ere ụbọchị ahụ. Nkea pụtara na erimeri ndị ahụ lazịrị n’iyi”.

Kaosiladi, ụfọdụ na-akọwa na o teela a gwara onye nwe ụlọ erimeri ahụ ka ọ chọọ ebe ọzọ.

Onye nta akụkọ anyị enweghị ike inweta Onyeisi ụlọ ọrụ ECDA, Hon Ken Onoh tupu e wepụta akụkọ a. 

Mana,  e tere ụgba, e tere azụ, ọ dị mkpa na “e gbute uru, e gbutekwa ọkpụkpụ”. Ya bụ “nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.