KADUNA: NWOKE AKPỤPỤWO ỌGỌ YA ỤLỌIKPE MAKA ỊKWANYERE NWA HA DỊ IME KA Ọ LỤỌ

Spread the love

Kaduna Steeti –Nwoke dị iri afọ atọ n’ise, Ibrahim Adamu, nọrọ ụnyahụ kpụpụ ọgọ ya nwoke nakwa ọgọ ya nwanyị ụlọikpe Sharịya na Magajin Gari Shari’a, Kaduna Steeti, maka ịkwagbunyere ya nwa ha nwanyị dị ime ka ọ lụọ. 

Onye a wetara mkpesa n’ihu ụlọikpe, onye bi n’obodo nta Rijjana,gwara ụlọikpe na ndị ọgọ ya Sani Dogon-Zikiri na Laura Sani jiri aghụghọ kwagbunye ya n’ịlụ nwa ha nwanyị ebe ọ dịịrị nwoke ọzọ ime.

O bokwara nwunye ya ahụ bụ  Nafisa Sani ebubo iso kpaa ya bụ nkata.

Onye ọka iwu nwoke gwara ụlọikpe sị “Nwamadị a na nwunye ya gara nnyocha ahụike maka afọ ime were chọpụta na nwunye ya dị ime izu ụka abụọ tupu agbam akwụkwọ ha. Oge ọ jụrụ nwunye ya, o kwukwara na ọ bụghị nwoke ahụ tuwara ya ime ahụ”

Ọ rịọrọ ụlọikpe ahụ ka onye ntimiwu ka ndị ahụ e boro ebubo kwuo onye ọ na-ekwu hit ere ego iti aka n’obi N100,000.

Kaosiladi,  ndị e boro ebubo sikwa n’aka ọka ikpe kwuo na-aka ha dị ọcha. Ọkaikpe ahụ kwuru na Nwamadị ahụ kaara itiku ọhaneze ozigbo ọ chọpụtara na nwunye ya dị ime, karịa ichere ka ọ mụchaa nwa. 

Ọkaiwu Malam Muhammad Adamu-Shehu higharịzịrị okwu ahụ ka ọ dịzịa n’abalị iri n’otu nke ọnwa Novemba.

Leave a Reply

Your email address will not be published.