LEGỌS:NDỊ YAHOO YAHOO ADỌSALA NWANYỊ GBA ỌTỌ N’ETITI ỤZỌ GBALAGA

Spread the love

Legọs: Onyonyoo nwata nwanyị gba ọtọ kwụrụ n’etiti ụzọ na-atamu jupụtara n’amaozi mkpakọrita(social media) dị iche iche.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-akọwa na ụgbọala kwụsịrị nwanyị ahụ ebe ahụ ma gbapụ n’ike tupu ndị mmadụ aghọta ihe na-eme oge o ji ọkara gafee elekere ise nke mgbede n’ebe Ajah, Legọs.

Onye hụrụ ihe merenụ, Amaka Ofor kwuru na ọ ga-abụ ndị ọgwụ ego mere ihe ahụ maka na nwanyị ahụ enweghị ike ikwu okwu ma ta fọdụ ịga ihe.

Onyeisi ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii, nkwata Ajah,  CSP Tabo Tukura,kwuru na ndị Uwe Ojii bugazịrị ya n’ụlọ ọgwụ Lagos University Teaching Hospital, Idi-Araba.

Tukura dọkwara aka ná ntị maka ụmụ agbọghọ ndị na-aga n’ụlọ egwu awantịlọ(night Club), na ihe ahụ agaghị agbalahụ aka ọrụ ndị yahoo yahoo, ndị na-eme ụdịrị mpụ dị iche iche, iji bute ego mbute.

Hmm, ọ mụrụ nkakwụ pịa ya ọnụ, ọ mụrụ awọ bee ya ọdụ. Ụmụ agbọghọ, piom piom piom, ihe anyị nọ ugbua bụ ọnwa mba. Anya saa unu, onye na-epio ọ mụrụ anya ka azụ (unu agaghị ekwe ma a sị unu epiola chaa chaa).

Ọ bụghị ya, ụmụ  okorobịa iwe na-ewe ewere unu chie eze;gbaa ‘ọkwụọtọekeleeze’ ma gbakwaa oringo so ya n’azụ. Ihe ka njọ bụ na ya na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ ga-esozi risaa ego ahụ e ji isi nwa agbọghọ onye ajọ were kpata.

Leave a Reply

Your email address will not be published.