Legọs – Banky W (Olubankole Wellington) nwa-afọ Naịjiriya na-eti egwu adọọla Basket mouth (Bright Ọkọcha), òmè ọ̀chị̀ (comedian) ka ọ hapụrụ ya ọmalincha nwunye ya. Nkea bụ maka na Basket mouth tinyere onyonyoo ya na Adesuwa Etomi, nwunye Banky W ma zigara nwoke mmadụ ozi a “@bankywellington Nnaa, ekwekwala iweooo!Read More →

Ọka – Nnukwu agha na-ada ugbua n’etiti ndị Anambara ndị ji ịgba egbe ọnụ ndọrọndọrọ ọchịchị n’ọba ozi mbaụwa eri ihe (political e-gladiators ) maka onyonyoo na-egosi Osodieme Ebele Obianọ, nwunye Aka na-achị Anambara Steeti ebe ọ nọ na Houston, Texas nke mba Amerịka were na-emere ndị ogbenye ndị ọchaRead More →

Abiokuta – N’Igbepa dị n’Okpuru Ọchịchị Shagamu nke Ogun Steeti, nwa a mụrụ ọhụrụ dị otu izu ụka anwụọla ka nna ya tanyechara kaịkaị n’ọnụ na mmemme ịgụ aha. Nwoke ahụ, Taofeek Ọlaoye tanyere nwa ya nwoke ahụ kaịkaị n’ọnụ etu o sịrị dị n’ime ala ndi Yoroba. Otu onyeRead More →

Enugwu – Ndi mmadụ ejiriwo iwe gbaa ụlọ ụka New Jerusalem King Ministry International, nke a makwaara dịka “Prophet talk-and-do” ọkụ n’Abakpa Nike, Enugwu. Prophet Talk-and – Do bụ onye amụma na-ewu ewu maka ọrụ ebube a sị na ọ na-arụ,ọ kacha ebe ụmụ nwanyị nọ. Kaosiladi, iko ‘Pastor’ arụrụRead More →

Kano – Nkatọ esochiela mmachi Gọọmenti Kano Steeti na-amachi nwoke na nwanyị ịbakọ otu keke site n’abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ ọzọ. Gọvanọ  Abdullahi Ganduje kwupụtara nkea ụbọchị Wenezdee na mmemme mmechi Ihe Ọmụmụ Alakụba oge ezumike nke otu Muslim Students Society of Nigeria (MSSN) mere na Mahadum Bayero,Read More →

Abiokuta –  Unu ahụla na Yoroba dị egwu? Fada Ekeresimesi bụ omenala ndị Ụka. Mana nkea egbochighi ndi Yoroba bụ ndị Alakụba isonye ụmụnne ndị na-aga ụka were mebe Fada Ekeresimesi. Na Shagamu, Musbau Abioye bụ otu onye Alakụba soro wee mee Fada Ekeresimesi. Na nghọta ya, ike ekike FadaRead More →

Abụja – Otu agadi nwanyị, Oriakụ Dọkaasị Osiebo, onye kwụsịrị ịhụ nsọ kemgbe 2006 amụtawo agadaga nwa nwoke. Dọkaasị,58,onye mụrụ nwa n’abalị iri n’atọ nke ọnwa Disemba, gara ndị nta akụkọ na ọ bụrụ ya ihe ọṅụ nakwa ihe mgbagwoju anya bụ ịmata site n’aka nwunye ụkọchukwu ya, onye bụkwaRead More →

Ụmụahịa – Ndi eze ọdịnala si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda(South East) na Ndịda Ndịda (South South) ekwuola hoo!haa! na ịchọ Bịafra bụzị iwu maka ọnọdụ ndị mpaghara abụọ ahụ nọ n’ime ya na Naịjiriya taa. Ndị Eze Ọdịnala ahụ kwuru nkea oge ha bịara mgbaru n’Obi Eze Afaraukwu maka ọnwụRead More →

Ụmụahịa – Ọkammụta Patrishia Etuna Mba eboola Onyeisi Mahadum Ọrụ Ugbo Maịkel Ọkpara, Ụmụdike ebubo ịchọ idina ya n’ike ugboro ugboro. Nwanyị kwukwara na Onyeisi mahadum ahụ kworo maka na ya jụrụ ka ha abụọ nwee mmekọahụ were kwụsị ụgwọ ọnwa ya kemgbe ọnwa Eprel afọ a. Ọkammụta Mba kọwaraRead More →

Enugwu –  Fada Ekeresimesi awuchiela Ala-Igbo n’ụtụtụ taa. Ebe ọ gbara ụkwụ nụ n’Ogige Nkiri anya Shoprite  Enugwu Ozi anyị nwetara bụ na nwoke a bu ihe onyinye dị iche iche were wuchie maka ime ụmụaka obi ụtọ n’oge Ekeresimesi a. Ya bụ ndị nne, ndị nna, hapụnụ ụmụaka unuRead More →

Legọs –  Ọkaikpe Mohammed Liman ke Ụlọikpe Etiti, Legọs nọrọ ụnyahụ were mewaa Sinetọ Ọjị Ụzọ – Kalụ obi site na ịjụ ịgbapụta ya n’aka ebe. Ọkaikpe a kagburu ihe abụọ Sinetọ a gbadoro ukwu ịrịọ mgbapụta n’akaebe ahụ bụ na ahụ adịghị ya, na ọ chọrọ ị ga hụRead More →

Hmm, ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ na-ada ugbua n’etiti Wizkid na Linda Ikeji. Ayọdeji Ibrahim Balogun, Wizkid, onye dị afọ iri abụọ n’itolu bụ “obere nwa na-ekwe ehi ọnụ”. Ọ naghị achọ ịma ọgbọ ya chaa chaa. O si na Tiwa Savage, onye ji afọ iri tọọ ya, ọ chọrọkwa LindaRead More →

Abụja – Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe Etiti anọrọla n’Abụja kwuo na imerime ụmụ nwanyị ndị Uwe Ojii jiri n’Abụja na mbido afọ a, ndị ha boro ebubo ịgba akwụla enweghị iwu ọbụla ha dara. Kama, Ọkaikpe ahụ kwuru na ọ bụ ndị Uwe Ojii n’onwe ha bụ ndị daraRead More →

Enugwu –  Ichie Chiwetalụ Agụ ekwuola hoo!haa! na ụmụ nwoke kwesịrị ịna-enye ndị nwunye ha ohere ịmepụta ihe n’ụwa, karịa sọọsọ idebe ha n’ụlọ dịka “ọmụ nwa”. Nwoke a bụ ochie dike na imebe ejije Nọliwuud kwuru nke n’uhuruchi ụbọchị Fraịdee ka e mechara ngosipụta ejije “Ọka Okoro” nke eRead More →

Ọka – Gọvanọ Anambara Steeti, Dọkịnta Wili Obianọ enyela Chinwe, dị afọ iri n’ise onye akwanyeburu ịlụ Izuchukwu Igwilo, nwoke dị afọ iri ise n’isii bụ ‘imbecile’ ohere agụmakwụkwọ n’efu. Mazị Harịsịn Gwamnishu, otu onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ wepụtara okwu banyere Chinwe na Febrụwarị nke afọ a.Read More →

Ado-Ekiti – Ndi nchị ehi Fulani ka hoo!haa!! nwetara ozi na ha achụpụwo ndị ụfọdụ obodo nta nọ na Iri-Ekiti, dịbere Isan-Ekiti n’Okpuru Ọchịchị Ido/Osi nke Ekiti Steeti bụ obodo Gọvanọ na-achị Ekiti Steeti, Jọn Kayode Fayemi. Ndị nchị ehi Fulani ahụ manyere ọkọrọtọ ha na-acha ọbara ọbara n’ala ubiRead More →