NHỌPỤTA GỌVANỌ IMO STEETI :CHI FADA MBAKA, Ọ DỊNYERE APC?

Spread the love

Enugwu – “Abịala hoo!” Ihe a bụ ihe pụrụ ọtụtụ mmadụ n’ọnụ oge Ụkọchukwu Ejike Mbaka buru amụma na Sinetọ Hope Ụzọdịmma nke APC ga-achụpụ Rt. Hon. Emeka Ihedioha nke PDP n’ọkwa dịka Gọvanọ Imo Steeti.

Ụkọchukwu a okwu ya na akpụ ọkụ n’ọnụ kwukwara na ya amaghị etu amụma ahụ ga-esi bịa na mmezi.

N’agbanyeghị nke, Fada Mbaka emeghị nkụja mgbe a na-eme ya akaja maka ahụ ọtụtụ mmadụ hụtara ka “amụma ndọrọndọrọ”.

O nweghị onye ghọtara ihe meziri onye bu ụzọ ji kpere azụ. Na ya bụ nhọpụta e mere n’abalị iri n’itolu nke ọnwa Maachị, afọ 2019, Ụzọdịmma gbara onye nke anọ, ebe Ihedioha bụ onye nke mbụ.

Kaọdịtaa, ọhaneze na-ajụzị sị, “Chi Fada Mbaka, ọ dịnyere APC?” Amụma nile o buru maka APC na-abịa na mmezu.

N’afọ 2015, oge o buru amụma na Chineke ajụwo Jọnatan nke PDP dịka Onyeisiala, na Buhari nke APC ga-anọchi ya, ọ bịara na mmezu n’agbanyeghị na ọ dịghị ọtụtụ mmadụ mma n’obi.

Hmm, Chi nwa Mbaka ọgụ dịkwa egwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.