MBAKA EDUOLA HOPE ỤZỌDỊMMA N’IYI ORU

Spread the love

Ụkọchukwu Elijah Ejike Mbaka eduola Sinetọ Hope Ụzọdịmma n’iyi ọrụ dịka Govano Imo Steeti.

Nwa Mbakọgụ bụ onye amụma Elijah anyị nwere taa na Naịjiriya n’agbanyeghị na amụma ọ na-ebuzi anaghị atọ Ndigbo ọchị chaa chaa.

Onyonyoo a gosiri ebe o nyere Sinetọ Ụzọdịmma ikike o jiri napụta “agụ ihe ọ kpụ n’ọnụ”.

http://www.hoohaa.com.ng/2018/07/25/mbaka-agwala-buhari-ka-o-gaa-rom-ga-rio-mgbaghara/

Hmm, 2023 ga-adị egwu! Ashụa ga – azụ. Onye ọbụla n’abịaghị hụ ‘Adoration’ bịa hụ Mbaka na ụmụ ikuku mara na o bidobeghi zọwa.

Ụkọchukwu a kwuru ya ekwu na ya amaghị etu amụma ahụ ga-esi bịa na mmezu mana na ihe Chineke ziri ya doro ya anya.

Hmm, ka egwu ka egwu, ọ bịara na mmezu

Ihe ọzọ fọdụrụ bụ na onye ọbụla Mbaka buuru amụma,  o mechaa banye n’ọchịchị, na Mbaka, dịka Elijah kwesịrị isochi onye ahụ iji hụ na ọ hapụghi nkwa o kwere Chukwu were gahie ụzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.