ODUMEJE ABỊAKWALA ỌZỌ : O CHEERE NDỊ DIBỊA AKA MGBA

Spread the love

Ọnịcha – Onye amụma na-ewu ewu, Chukwuemeka Ohanaemere, onye aha otutu ya Odumeje echeerela ndị dibịa “aka mgba mbilite n’ọnwụ” n’ama ozi Twitter.

N’onyonyoo pụtara ọhụrụ, Odumeje cheere ndị dibịa nile nọ na Naịjiriya aka mgba, ma kpọkwaa ha  ndị omekome, ma kwuo na e nwere sọọsọ otu Chineke, na ike nile dị n’aka Jeso.

Onye amụma ahụ kwukwara sị, onye dibịa ọbụla obi kara ya zute ya n’ama egwuregwu, ebe a ga-ebute ozu abụọ ka ndị mmadụ kirie mara  nke ga-ebilite n’ọnwụ, ma ọ ga-abụ ozu nke e busaara ya ka ọ ga-abụ nke nwa dibịa.

Hmm, ọ ga-adịkwa egwu.

“Odumeje mmọnwụ! Odumeje agaba!”

Geenụ ntị n’okwu Odumeje:

“Ofu onye a na-anụ ụda egbe?”

“A na-akpọ ọga n’Express?”

“Onye nọ na keke a na-etinye seat Belt?

Leave a Reply

Your email address will not be published.