AKURE: NDỊ FULANI HAPỤRỤ EHI HA ZỌWA ISI ONWE HA

Spread the love

Akure –  Ndi nchị ehi ndị Fulani hapụrụ ehi ha ụnyahụ were gbalaga, iji zọ isi onwe ha oge ndị Ichie duru ụmụ okorobịa iwe ji were wakpo ha maka mkpa mkpa ha na be ha. 

Nkea mere na Ijare dị n’Okpuru Ọchịchị Ifedore nke Ondo Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ndị eteela ha jiri adọ ndị nchị ehi ahụ aka na ntị tupu oge ahụ maka etu ehi ha si emebi ugbo ha.

Kama ịhapụ obodo ahụ, ndị nchị ehi ahụ bamiri n’ime ime ọhịa  mana ndị obodo ahụ chọrọ ha bịa were nye ha ọsọ.

Ụmụ okorobịa ahụ chịrị ehi ahụ ha hapụrụ ruru otu narị chịga n’obi nke Eze Ọdịnala ha,  Olujare n’Ijare, Oba Oluwagbemigun Kokotiri maka nchekwa.

Otu onye obodo ahụ kwuru sị: ” O teela ndị nchi ehi a ji eme anyị ihe. Anyị emeghị ha ihe ọbụla mana ọ tụrụ anyị n’anya etu ha siri gbalaga ka onye ọdụm na-achụ ọsọ.

Chetakwa na n’afọ gara aga, egbeigwe gbagburu ọtụtụ ehi ndị Fulani n’obodo ahụ.

Hmm, ọsọ  chụrụ onye Fulani o ji hapụ ehi ya gbalaga  abụghị obere ọsọ. Unu ahụla na o nweghị onye ndụ anaghị atọ ụtọ, ma ndị na-akpa arụ, ma ndị ogbu mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.