IMO STEETI :OKORỌCHA NKE NTA PỤRỤ, OKORỌCHA NKE UKWU BANYE

Spread the love

Kano – Okenye ọchịchị, Alahaji Tanko Yakasai ekwupụtala ụjọ ya na site na udiri mkpebi ụlọikpe na-enyezi taa na Naịjiriya gosiri n’ezie na e jituola Ngalaba Ikpe Nkwụmọtọ n’ọchịchị nọzị ugbua.

Ọ sịrị na n’agbanyeghị na ya anọghị na PDP ma ọ bụkwanụ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, na  mkpebi ụlọikpe Mkpedebe banyere nhọpụta Gọvanọ Imo Steeti dị mwute maka na “Okorọcha nke nta pụrụ, Okorọcha nke ukwu banye n’ọkwa n’Imo Steeti”

Yakassai rụtụrụ aka na mmeri APC n’ime Steeti tinyekwara mmeri ha na nso a na Bayelsa Steeti gosiri na aka ndị soja ndị APC ji emewo ka ha banyenwuo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe ekwenwughi ha ọgịga na mbụ.

Okenye ọchịchị a kwuru na mkpebi ụlọikpe mkpede ahụ tụrụ ya n’anya ma gosikwa na ndị APC chọrọ iji ụlọikpe were na eweghara ihe ha enwetanwughi site na mbinye aka, na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ amapụtala atụmatụ dị egwu ha na-eji enwetazi mmeri n’Ụlọikpe karịa n’ogige nhọpụta.

O kwuru na ọnọdụ a kwesịrị ịna ewute onye ọbụla hụrụ ọchịchị ọhakarasị n’anya na Naịjiriya.

“Ihe ala anyị chọrọ ugbua bụ ụlọ ọrụ ime nhọpụta ga-adị uchu n’ọrụ, ngalaba ikpe nkwụmọtọ gbasiri ike nakwa ngalaba nta akụkọ obi kara, iji zọpụta ọchịchị ọhakarasị Naịjiriya.

” Nsogbu m bụ na anyị na-abanyezi n’ọchịchị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị (one Party state) maka na anaghịkwa enye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị anọghị n’ọkwa ohere ikute ume chaa chaa”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.